Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! NỌVEMBA 2015

 IHE BAỊBỤL KWURU

Ịda ogbenye

Ịda ogbenye

N’agbanyeghị mbọ ndị mmadụ na-agba ka ha kwụsị ndị mmadụ ịda ogbenye, ihe ka na-esiri ọtụtụ nde mmadụ ike.

Gịnị ga-eme ka ndị dara ogbenye na-enwe obi ụtọ?

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị na-ekwu na inwe akụnụba bụ ihe na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ nakwa na ego ole mmadụ nwere ga-egosi ma ihe ọ̀ na-agaziri ya ma ọ bụkwanụ na ọ naghị agaziri ya. Ndị dara ogbenye anaghị enwecha ike ịga ụdị ụlọ akwụkwọ ha chọrọ, ịga ezigbo ụlọ ọgwụ ma ahụ́ rịawa ha, ma ọ bụkwanụ ime ihe ndị ọzọ dị́ ha mkpa. N’ihi ya, ndị mmadụ nwere ike ịna-eche na o nweghị ihe ga-eme ka ndị dị́ otú ahụ na-enwe obi ụtọ ná ndụ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na ihe ga-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ bụ onye ahụ na Chineke ịdị ná mma, ọ bụghị inwe akụnụba. Baịbụl kwuru, sị: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.” (Matiu 5:3) N’agbanyeghị ego ole ndị ọ bụla maara mkpa ime mmụọ ha nwere, ha na-agbalị ịmata ihe Chineke chọrọ ha n’aka. Ha na-esi otú ahụ mụta eziokwu ndị na-eme ka obi ruo mmadụ ala Baịbụl na-akụzi. Ọ bụ ihe ndị a a na-amụta na Baịbụl na-eme ka mmadụ na-enwe ezigbo obi ụtọ.

Ndị na-eme ihe Baịbụl kwuru agaghị enwe nnukwu nsogbu ma ọ bụrụ na ihe esiere ha ike. Dị ka ihe atụ, ihe Baịbụl kwuru na-eme ka ndị mmadụ zere àgwà ọjọọ ndị dị ka ịṅụ sịga na ịṅụfe mmanya ókè. Ụdị àgwà ndị a na-eri mmadụ ego, a na-ejikwa nnukwu ego agwọ ọrịa ndị ha na-akpata.—Ilu 20:1; 2 Ndị Kọrịnt 7:1.

Baịbụl na-adụkwa anyị ọdụ ka anyị zere anyaukwu na ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ. (Mak 4:19; Ndị Efesọs 5:3) Mmadụ mee ihe ndị a Baịbụl kwuru, ọ gaghị na-atụfu ego n’ịgba chaa chaa, ọ gaghịkwa ahụ ego n’anya. Baịbụl kwudịrị na “ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.” (1 Timoti 6:10) Baịbụl kwukwara, sị: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) E nweghị ego ole mmadụ nwere ga-eme ka ọ ghara ịnwụ. Ma, ime ihe Baịbụl kwuru na-eme ka ndụ mmadụ nwee isi, onye ahụ ana-enwekwa obi ụtọ.

Ọ bụ eziokwu na ọ ga na-esiri ndị ụwa na-atụ n’ọnụ ike inweta ihe ha ga-eri, ákwà ha ga-eyi nakwa ebe ha ga-ebi, ha ga-enweli obi ụtọ ma ọ bụrụ na ihe ha nwere eju ha afọ. Ihe ọzọ ga-enyere ha aka bụ ife Chineke na ime ihe ọ chọrọ. Ihe mere o ji dị mkpa bụ na “ọ bụ ngọzi Jehova na-eme mmadụ ọgaranya, ọ dịghịkwa atụkwasị ihe mgbu na ya.”—Ilu 10:22.

AMAOKWU BAỊBỤL Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: “Obi ụtọ na-adịrị ndị maara mkpa ime mmụọ ha.”Matiu 5:3.

 È nwere mgbe ịda ogbenye ga-akwụsị?

IHE BAỊBỤL KWURU

Ndị mmadụ enwebeghị ike ime ka ụmụ mmadụ kwụsị ịda ogbenye n’agbanyeghị mbọ niile ha na-agba. Ma, Chineke ga-eme ka ụmụ mmadụ kwụsị ịda ogbenye. Ọ ga-ewepụ ihe na-akpata ya, ya bụ, ụmụ mmadụ na-erigbu ibe ha nakwa ndị ọchịchị na-asụ ndị ha na-achị akwụ. (Ekliziastis 8:9) Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ. Ọ ga-eji ọchịchị ya nye ụmụ mmadụ ihe na-agụ ha, ọ gaghịkwa enye ụfọdụ hapụ ụfọdụ. Baịbụl kwuru na Eze Alaeze Chineke ga-egboro ndị ogbenye mkpa ha. O kwuru, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka . . . Ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere, ọ ga-azọpụtakwa mkpụrụ obi ndị ogbenye.”—Abụ Ọma 72:12-14.

Ụwa ga-aghọ paradaịs n’ọdịnihu. N’oge ahụ, onye ọ bụla ga-enwe ụlọ nke ya, nri ga-eju ebe niile. E nweghịkwa onye ga-abụ ogbenye. N’akwụkwọ Aịzaya, Chineke kwuru gbasara ndị na-efe ya, sị: “Ha ga-ewu ụlọ, biri n’ime ha; ha ga-akọkwa ubi vaịn, rie mkpụrụ ha. . . . Ndị m họọrọ ga-eji ihe aka ha rụpụtara mee ihe n’uju.” (Aịzaya 65:21, 22) Ihe ọ pụtara bụ na ndị mmadụ agaghịzi na-adọlị naanị ka ha nweta obere ihe ha ga-eri. Kama, ha ga na-enwe “oké oriri nke ihe mara abụba” nakwa ihe ọma ndị ọzọ Jehova ga-enye ha.—Aịzaya 25:6.

GỊNỊ MERE NKWA A JI DỊ MKPA?

Nkwa Chineke kwere na ụwa ga-adị mma n’ọdịnihu na-akasi ndị ụwa na-atụ n’ọnụ obi na Chineke na-eche gbasara ha nakwa na nsogbu ha ga-ebi n’oge na-adịghị anya. Mmadụ buru nkwa a n’obi, ọ ga-enwe ike idi nsogbu ọ bụla bịaara ya ugbu a.

AMAOKWU BAỊBỤL Ị GA-ECHEBARA ECHICHE: “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka . . . Ọ ga-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya na ogbenye ebere, ọ ga-azọpụtakwa mkpụrụ obi ndị ogbenye.”Abụ Ọma 72:12, 13.

GỤKWUO GBASARA YA

Gịnị Bụ Alaeze Chineke?

Onye bụ Eze Alaeze Chineke, gịnị ka Alaeze Chineke ga-emere ụmụ mmadụ?

Gịnị Mere Chineke Ji Kwe Ka Ihe Ọjọọ na Ahụhụ Dịrị?

Olee otú ihe ọjọọ si malite, gịnị mere Chineke ji gbachi nkịtị ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ ruo ugbu a? È nwere mgbe ahụhụ ga-akwụsị?

Olee Otú Iwu Chineke Si Abara Anyị Uru?

Jizọs kọwara ihe mere o ji dị mma ka Chineke na-eduzi anyị, kwuokwa banyere iwu abụọ kacha mkpa.