Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! SEPTEMBA 2015

 IHE BAỊBỤL KWURU

Mmadụ Ịnabata Mmadụ Ibe Ya

Mmadụ Ịnabata Mmadụ Ibe Ya

Ọ bụrụ na ndị mmadụ ejiri obi ha niile na-anabata ibe ha ma na-agbaghara ha, ọ ga-eme ka ha nọgide na-adị ná mma. Ma, ò nwere mgbe anyị kwesịrị izere ụfọdụ ndị?

Gịnị ga-enyere ndị mmadụ aka ịna-anabata ibe ha?

IHE NA-EME N’ỤWA TAA

N’ụwa niile, ọtụtụ ndị na ibe ha anaghị anọ n’udo. Ụfọdụ n’ime ihe ndị na-eme ka ọ na-aka njọ bụ iro ndị mmadụ na-ebuso ibe ha n’ihi obodo ha si, agbụrụ ha, ma ọ bụkwanụ okpukpe ha na-ekpe.

IHE BAỊBỤL KWURU

Mgbe Jizọs Kraịst nọ n’ụwa, ọtụtụ ndị na ibe ha adịghị ná mma. Dị ka ihe atụ, ndị Juu na ndị Sameria ejighị anya ahụ ibe ha. (Jọn 4:9) Ndị mmadụ na-ekwu n’oge ahụ na ụmụ nwoke dị mkpa karịa ụmụ nwaanyị. Ndị ndú okpukpe enweghịkwa ihe ha ji ndị mmadụ kpọrọ n’oge ahụ. (Jọn 7:49) Ma, Jizọs Kraịst emeghị ka ha. Ndị Farisii na ndị odeakwụkwọ kwudịrị gbasara ya, sị: “Nwoke a na-anabata ndị mmehie, sorokwa ha na-eri ihe.” (Luk 15:2) Jizọs meere ndị mmadụ ihe ọma, nwekwaara ha ndidi n’ihi na ihe mere o ji bịa n’ụwa abụghị ka o kpee ha ikpe, kama ka o nyere ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma. Ọ bụ ịhụnanya mere o ji mee ihe ndị ahụ.—Jọn 3:17; 13:34.

Ihe mere Jizọs ji bịa n’ụwa abụghị ka o kpee ndị mmadụ ikpe, kama ka o nyere ha aka ka ha na Chineke dịrị ná mma

Ịhụnanya na-eme ka anyị na-enwere ndị ọzọ ndidi. Ọ na-emekwa ka anyị jiri obi anyị niile na-anabata ndị ọzọ n’agbanyeghị na ha ezughị okè. Ndị Kọlọsi 3:13 kwuru, sị: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya.”

“Karịsịa ihe niile, nweenụ ịhụnanya siri ike n’ebe ibe unu nọ, n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.”1 Pita 4:8.

 Gịnị mere na ọ bụghị mmadụ niile ka anyị ga na-anabata?

N’ỌTỤTỤ EBE TAA,

ndị ọchịchị na-agba mbọ iji hụ na ihe na-aga nke ọma n’obodo. N’ihi ya, ha na-eme iwu ga-eme ka ndị mmadụ na-akpa ezigbo àgwà.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na ‘ịhụnanya adịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị.’ (1 Ndị Kọrịnt 13:5) Ọ bụ eziokwu na mgbe Jizọs bịara n’ụwa, ọ nabatara ndị dị iche iche, ma ọ gbachighị ndị ihu abụọ ma ọ bụ ndị na-eme ihe ọjọọ ndị ọzọ nkịtị. Kama, ọ gwara ha hoo haa na ihe ha na-eme adịghị mma. (Matiu 23:13) Ọ gwakwara ha na ‘onye na-eme ihe ọjọọ kpọrọ ìhè nke eziokwu asị.’—Jọn 3:20.

Pọl onyeozi kwuru, sị: “Kpọọnụ ihe ọjọọ asị, jidesienụ ezi ihe ike.” (Ndị Rom 12:9) Yanwa kpọkwara ihe ọjọọ asị. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị Juu ụfọdụ bụ́ Ndị Kraịst mere ka hà na-asọ ndị na-abụghị ndị Juu ghọrọ Ndị Kraịst asọ, Pọl gwara ha hoo haa na ihe ha na-eme adịghị mma n’agbanyeghị na yanwa bụ onye Juu. (Ndị Galeshia 2:11-14) Ọ ma na Chineke achọghị ka ndị na-efe ya na-asọ ibe ha asọ n’ihi agbụrụ ha maka na “Chineke adịghị ele mmadụ anya n’ihu.”—Ọrụ Ndịozi 10:34.

Ndịàmà Jehova na-agba mbọ ka ihe ọ bụla ha na-eme bụrụ ihe Baịbụl kwuru. (Aịzaya 33:22) N’ihi ya, ha anaghị agbachi onye ọ bụla n’ime ha mere ihe ọjọọ nkịtị. Baịbụl kwuru, sị: “Wepụnụ onye ọjọọ ahụ n’etiti unu.” (1 Ndị Kọrịnt 5:11-13) Ndịàmà Jehova na-eme ihe a Baịbụl kwuru n’ihi na ha ghọtara na onye na-eme ihe ọjọọ ekwesịghị ịnọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst.

“Unu ndị hụrụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.”Abụ Ọma 97:10.

Chineke ọ̀ ga-agba nkịtị ka ndị ọjọọ mere ihe ọjọọ na-aga?

IHE ỌTỤTỤ NDỊ CHERE BỤ

na ebe ọ bụ na o nweghị onye zuru okè, ihe ọjọọ enweghị nkwụsị.

IHE BAỊBỤL KWURU

Habakọk onye amụma jụrụ Jehova, sị: ‘Gịnị mere i ji na-ele nsogbu n’anya n’anya? Gịnị mere e ji na-ebukọrọ ihe ndị mmadụ, na-emekwa ihe ike n’ihu m, gịnị mere esemokwu ji na-adị, gịnịkwa mere e ji na-alụ ọgụ?’ (Habakọk 1:3) Chineke kwere Habakọk nkwa na ya agaghị agba nkịtị ka ndị ọjọọ mere ihe ọjọọ na-aga. Ọ gwakwara ya na nkwa ahụ o kwere “ga-emezurịrị” nakwa na “ọ gaghị anọ ọdụ.”—Habakọk 2:3.

Ka ọ dị ugbu a, ohere ka dịịrị ndị ajọ omume ịkwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Baịbụl kwuru, sị: “‘Ọnwụ onye ajọ omume ọ̀ na-atọ m ụtọ n’ụzọ ọ bụla,’ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘ihe na-atọ m ụtọ ọ́ bụghị ka ọ hapụ ụzọ ya wee dịrị ndụ?’” (Ezikiel 18:23) Ọ bụrụ na ndị na-eme ihe ọjọọ ahapụ ụzọ ọjọọ ha ma fewe Jehova, ha agaghị na-atụ egwu ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ilu 1:33 kwuru, sị: “Onye na-ege m ntị ga-ebi n’obi iru ala, ụjọ ọdachi agaghịkwa enye ya nsogbu.”

“N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ . . . Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”Abụ Ọma 37:10, 11.

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Ụdị Onye Chineke Bụ?

Gịnị ka ị ma gbasara Chineke? Olee otú anyị nwere ike isi matakwuo ya?

Otú Chineke Ga-esi Eme Ka Ihe Ọjọọ Kwụsị

Ọ̀ ga-adị gị mma ka i biri n’ụwa mgbe ihe ọjọọ ọ bụla na-agaghị eme ndị ezigbo mmadụ?