Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! MEE 2015

 ISIOKWU TETA! A

Chineke Ọ̀ Dị? Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịma ma Ọ̀ Dị?

Chineke Ọ̀ Dị? Gịnị Mere Anyị Ji Kwesị Ịma ma Ọ̀ Dị?

Ọtụtụ ndị amaghị ma Chineke ọ̀ dị. Ha anaghịkwa achọ ịma ma ọ̀ dị. Otu nwoke Frans aha ya bụ Hervé kwuru, sị: “Ọ bụ eziokwu na agaghị m asị na amaghị m ma Chineke ọ̀ dị ma ọ bụkwanụ kwuo hoo haa na ọ dịghị, ekweghị m na Chineke. N’uche m, otú ka mma anyị kwesịrị isi na-ebi ndụ bụ ime ihe ọ bụla obi anyị gwara anyị. Ọ baghị uru ikwutewe okwu Chineke.”

Otu onye Amerịka aha ya bụ John kwuru, sị: “Papa m na mama m ekweghị na Chineke. N’ihi ya, mgbe m na-etolite, amaghị m ma Chineke ọ̀ dị. Ma mgbe ụfọdụ, m na-eche ma ọ̀ ga-abụ na Chineke dị.” Ndị ọzọ nwekwara ike ịna-eche ụdị ihe a John na-eche.

È nwetụla mgbe ị jụrụ onwe gị ma Chineke ọ̀ dị nakwa na ọ bụrụ na ọ dị n’eziokwu, ò nwere ihe ọzọ mere o ji kee ụmụ mmadụ? O nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na e nwere ihe ụfọdụ a na-agaghị akọwali ma ọ bụrụ na Chineke adịghị. Dị ka ihe atụ, e nwere ihe ndị gosiri na ihe ndị dị ndụ anọkataghị jiri aka ha dịrị. Ihe ndị sayensị chọpụtarala gosiri na ihe ndị dị n’ụwa a na-enyere ihe ndị dị ndụ aka. Ihe a niile gosiri na ọ ga-enwerịrị onye kere ha.—Gụọ igbe isiokwu ya bụ “ Gbalịa Mata nke Bụ́ Eziokwu.”

Ihe a anyị kwuru ugbu a ga-abara anyị ezigbo uru ma anyị chọpụta ihe ndị gosiri na Chineke dị n’eziokwu nakwa ihe ndị bụ́ eziokwu gbasara ya. Ka anyị leba anya n’uru anọ anyị ga-erite.

 1. ANYỊ GA-AGHỌTA IHE MERE E JI KEE ANYỊ

Ọ bụrụ na e nwere ihe ọzọ mere Chineke ji kee ụmụ mmadụ, anyị kwesịrị ịmata ihe ọ bụ na otú o si gbasa anyị. Ọ bụrụ na Chineke dị n’eziokwu ma anyị amaghị ihe ọ bụla gbasara ya, ọ pụtaranụ na e nwere ihe dị ezigbo mkpa anyị na-amaghị.

Baịbụl kwuru na ọ bụ Chineke kere ihe niile dị ndụ. (Mkpughe 4:11) Ọ bụrụ na anyị eburu ihe a n’obi, olee uru ọ ga-abara anyị? Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru gbasara ya.

A bịa n’ihe niile Chineke kere n’ụwa, ụmụ mmadụ dị iche. Baịbụl kwuru na Chineke kere anyị ka anyị yie ya, ya bụ, ka anyị na-akpa àgwà ka ya. (Jenesis 1:27) Baịbụl kwukwara na anyị na Chineke nwere ike ịdị ná mma. (Jems 2:23) E nweghị ihe ga-eme ka ndụ anyị nwee isi ma ọ bụrụ na anyị na Onye kere anyị adịghị ná mma.

Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị na Chineke dịrị ná mma? Anyị na Chineke dịrị ná mma, anyị nwere ike ịkọrọ ya mkpa anyị. O kwekwara anyị nkwa na ya ga-ege anyị ntị ma nyere anyị aka. (Abụ Ọma 91:15) Anyị na Chineke dịrị ná mma, anyị ga-ama ihe bụ́ uche ya gbasara ọtụtụ ihe. Anyị mara uche ya, anyị ga-enwe ike ịma ọtụtụ ihe gbasara ndụ anyị.

Ọ bụrụ na Chineke dị n’eziokwu ma anyị amaghị ihe ọ bụla gbasara ya, ọ pụtaranụ na e nwere ihe dị ezigbo mkpa anyị na-amaghị

2. OBI GA-ERU ANYỊ ALA

Ọ na-esiri ụfọdụ ndị ike ikweta na Chineke dị n’ihi ahụhụ juru n’ụwa a. Ha nwere ike ịna-eche na ọ bụrụ na Chineke nwere ike na-enweghị atụ, gịnị mere o ji kwe ka ahụhụ na ihe ọjọọ dịrị?

Baịbụl kwuru na mgbe Chineke kere ụmụ mmadụ, o bughị n’obi ka ha na-ata ahụhụ ma ọ bụ na-anwụ anwụ. Ihe a o kwuru na-akasị anyị obi. (Jenesis 2:7-9, 15-17) Ihe a Baịbụl kwuru ọ̀ bụ ụgha? Mba. Ọ bụrụ na e nwere onye nwere ike na-enweghị atụ nke kere ihe niile, ọ bụrụkwa na ịhụnanya bụ àgwà ya kacha àgwà ya ndị ọzọ, o doro anya na ọ bụ ụdị ndụ a ka ọ ga-achọ ka ụmụ mmadụ na-ebi.

Ma, gịnị mere imi na anya ji dị ụmụ mmadụ otú ọ dị ha taa? Baịbụl kwuru na Chineke kere ụmụ mmadụ otú ha ga na-ekpebi ihe ọ bụla ha chọrọ ime, ọ naghị amanye ha ife ya. Adam na Iv nupụụrụ Chineke isi ma họrọ ime ihe ha chọrọ. (Jenesis 3:1-6, 22-24) Anyị na-atazi ahụhụ ihe ahụ ha mere.

Obi ga-eru anyị ala ma anyị ghọta na mgbe Chineke kere ụmụ mmadụ, o bughị n’obi ka ha na-ata ahụhụ. Ma, anyị niile chọrọ ka ahụhụ anyị na-ata kwụsị. Anyị chọkwara ihe ga-emesi anyị obi ike na ihe ga-emecha dị mma.

 3. ANYỊ GA-ENWE NCHEKWUBE

Ozugbo Adam na Iv nupụchaara Chineke isi, Chineke kwere nkwa na ya ga-emecha mezuo ihe o bu n’obi kee ụwa. O nweghị ihe ga-egbochi ya ime ya n’ihi na o nwere ike ime ihe ọ bụla ọ chọrọ. (Aịzaya 55:11) N’oge na-adịghị anya, Chineke ga-akwụsị nsogbu niile isi ahụ e nupụụrụ ya kpatara ma mezuo ihe o bu n’obi kee ụwa na ụmụ mmadụ.

Olee uru ọ ga-abara anyị ma Chineke mee ya? Ka anyị tụlee nkwa abụọ n’ime nkwa ndị Chineke kwere na Baịbụl gbasara ọdịnihu.

  • AJỌ OMUME GA-AKWỤSỊ, UDO ADỊRỊKWA EBE NIILE. “N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ; ị ga-elekwa anya n’ebe ọ na-anọ, ma ọ gaghị anọ ya. Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.”—Abụ Ọma 37:10, 11.

  • ỌRỊA NA ỌNWỤ GA-AKWỤSỊ. “Ọ dịghị onye bi na ya nke ga-asị: ‘Ana m arịa ọrịa.’” (Aịzaya 33:24) “Ọ ga-eloda ọnwụ ruo mgbe ebighị ebi, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-ehichapụkwa anya mmiri n’ihu niile.”—Aịzaya 25:8.

Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na Chineke ga-emere anyị ihe ndị o kwere anyị ná nkwa? Ọ bụ n’ihi na ọtụtụ amụma ndị dị na Baịbụl emezuola. Nkwa ndị a Chineke kwere anyị ọ̀ pụtara na anyị agaghịzi na-enwe nsogbu ugbu a? Mba. Olee otú Chineke si enyere anyị aka idi nsogbu ndị ahụ?

4. ANYỊ GA-AMA OTÚ ANYỊ GA-ESI MERIE NSOGBU ANYỊ, MEEKWA MKPEBI DỊ MMA

Chineke na-akụziri anyị ihe ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị ga-eme ma nsogbu bịara anyị ma ọ bụ ma anyị nwee mkpebi anyị chọrọ ime. Mgbe ụfọdụ, anyị na-eme mkpebi ndị dị ezigbo mkpa, nweekwa mgbe anyị na-eme ndị nke na-adịchaghị mkpa. Ọ bụ eziokwu na ụmụ mmadụ nwere ike ịgwa anyị ihe ga-enyere anyị aka ná ndụ, ma ọ gaghị abara anyị uru ka ihe Chineke gwara anyị. Chineke ma ihe ndị merela eme nakwa ihe ndị ga-eme n’ọdịnihu. Ọ bụkwa ya kere anyị.

Ihe dị na Baịbụl bụ uche Chineke n’ihi na ọ bụ ya gwara ndị dere ya ihe ha dere. Jehova kwuru na Baịbụl, sị: “Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru, Onye na-eme ka i jee ije n’ụzọ i kwesịrị iso.”—Aịzaya 48:17, 18.

Ike Chineke enweghị atụ. Ọ chọkwara iji ya nyere anyị aka n’ihi na ọ bụ nna anyị, hụkwa anyị n’anya. Baịbụl kwuru gbasara ya, sị: ‘Nna unu nke nọ n’eluigwe ga-enye ndị na-arịọ ya mmụọ nsọ.’ (Luk 11:13) Chineke ji mmụọ nsọ ya eduzi anyị ma na-enyere anyị aka.

Gịnị ka anyị ga-eme ka Chineke nyere anyị aka? Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-abịaru Chineke nso aghaghị ikwere na ọ dị adị, na ọ bụkwa onye na-akwụ ndị na-achọsi ya ike ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Ihe ga-enyere anyị aka ikweta na Chineke dị bụ ileba anya n’ihe ndị gosiri na ọ dị n’eziokwu.

GBALỊA MATA ONYE Ọ BỤ

Ịmata eziokwu gbasara Chineke na-ewe oge, ma ọ ga-abara gị uru ma ị gbalịa mata onye ọ bụ. Otu nwoke onye Chaịna bi Amerịka kwuru, sị: “Na mbụ, m kweere na e keghị mmadụ eke. N’agbanyeghị na ọ bụ ihe m kweere, ọ gụrụ m agụụ ịmata ihe Baịbụl na-ekwu. N’ihi ya, mụ na Ndịàmà Jehova malitere ịmụ Baịbụl. Ma n’afọ ikpeazụ m na mahadum, ọ bịara na-esiri m ike inwe ohere mụ na ha ga-eji na-amụ Baịbụl. Obi adịghịkwa m mma n’oge ahụ. Mgbe m maliteghachiri ịmụ Baịbụl, m bidoro nwewe obi ụtọ.”

Ị̀ ga-achọ ịmụtakwu gbasara Onye kere anyị bụ́ Jehova Chineke? Ọ ga-adị mma ka i wepụta oge mụọ gbasara ya ka ị mara onye ọ bụ n’eziokwu.

GỤKWUO GBASARA YA

Chineke Ò Nwere Aha?

A na-etu Chineke ọtụtụ aha ndị dị ka, Nna, Onye Okike, na Onyenwe anyị. Vidio a gosiri na aha Chineke gbara ihe karịrị ugboro puku asaa na Baịbụl.

Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?

Baịbụl na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ezigbo mkpa. Ị̀ ga-achọ ka Baịbụl nyere gị aka?