Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! JULAỊ 2014

 ISIOKWU TETA! A

Gịnị Ka E Ji Ama Ezigbo Enyi?

Gịnị Ka E Ji Ama Ezigbo Enyi?

N’ABALỊ iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba 2010, otu nwaanyị onye Briten dị afọ iri anọ na abụọ degaara ndị enyi ya ozi n’ebe ha na-akparịta ụka n’Ịntanet na ya chọrọ igbu onwe ya. O dere ozi ahụ ka ọ ga-abụ ndị enyi ya hụ ya, ha agbatara ya ọsọ enyemaka. N’agbanyeghị na ndị enyi ya ya na ha na-akpa n’Ịntanet karịrị otu puku, e nweghị otu n’ime ha gbataara ya ọsọ enyemaka. N’echi ya, ihe ndị uwe ojii hụziri bụ ozu nwaanyị ahụ. Gịnị mere? O nwere ọgwụ ọ ṅụrụ, ya egbuo ya.

Taa, nkà na ụzụ ọgbara ọhụrụ na-eme ka ndị mmadụ nwee ike inweta ọtụtụ ndị enyi n’Ịntanet. Naanị ihe onye chọrọ inweta enyi ga-eme bụ idenye aha onye ọ chọrọ ka o soro ná ndị enyi ya. E nwee onye onye ahụ na-achọghịzi ka ọ bụrụ enyi ya, ya akachapụ aha ya. Ma, ihe mere nwaanyị ahụ anyị kwuru okwu ya gosiri na ezigbo enyi dị ụkọ. Otu nchọpụta e mere gosiri na n’agbanyeghị na ndị mmadụ na ibe ha na-akparịta karịa ka a na-emebu, ọtụtụ enweghị ndị ha ga-akpọ ezigbo enyi ha.

Ọtụtụ ndị ma na mmadụ inwe ezigbo enyi bara uru. Ọ ga-abụkwa na gịnwa kwetara. O nwekwara ike ịbụ na ị ma na ọ bụghị idenye aha mmadụ ná ndị enyi gị n’Ịntanet ga-eme ka gị na onye ahụ bụrụ enyi. Olee ụdị onye ị chọrọ ka ọ bụrụ enyi gị? Olee otú ị ga-esi bụrụ ezigbo enyi mmadụ? Gịnị ka ị ga-eme ka gị na enyi gị dị n’ezigbo mma?

Ka anyị kwuo ihe anọ nwere ike inyere anyị aka nakwa amaokwu Baịbụl ndị ga-enyere anyị aka ịna-akpa àgwà ga-eme ka ndị ọzọ chọọ ka anyị bụrụ enyi ha.

 1. Na-eme Ihe Gosiri na Ị Hụrụ Ya n’Anya

Anyị ekwesịghị ịbụ enyi mmadụ n’ọnụ. Ihe ọ pụtara bụ na ezigbo enyi mmadụ na-enyere ya aka, na-emekwara ya ihe na-egosi na ọ hụrụ ya n’anya. Ị manụ na ọ bụ aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri. N’ihi ya, enyi na enyi kwesịrị ịna-emere ibe ha ihe, hụkwa ibe ha n’anya. Aka ọ bụla i nyeere enyi gị efughị ọhịa. Jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ nwere ike iwepụta onwe m jiri oge m na ihe ndị m nwere mee ihe ga-abara enyi m uru?’ Cheta na ọ bụrụ na ị chọrọ inwe ezigbo enyi, gịnwa ga-abụ ezigbo enyi.

ỤDỊ ONYE NDỊ MMADỤ NA-ACHỌ IMETE ENYI

Otu nwaanyị aha ya bụ Irene, sịrị: “Ebe ọ bụ aka ájá ájá na-ebute ọnụ mmanụ mmanụ, mmadụ ga na-agba mbọ ka ya na enyi ya dị n’ezigbo mma. Buru ụzọ kpebie na ị ga-abụ ezigbo enyi. Na-emere enyi gị ihe ọma, gosikwa ya na ihe gbasara ya na-emetụ gị n’obi. Wepụtakwa oge ị ga-eji na-enyere ya aka.”

Otu nwoke aha ya bụ Luis Alfonso, sịrị: “Ndị mmadụ na-achọkarị naanị ihe ga-abara ha. Ha anaghị enyere ndị ọzọ aka. N’ihi ya, obi na-adị anyị ụtọ ma e nwee onye na-emere anyị ihe n’ebughị n’obi inweta ihe n’aka anyị.”

GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

“Otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ. Na-enyenụ ihe, ndị mmadụ ga-enyekwa unu ihe.” (Luk 6:31, 38) Ihe Jizọs na-ekwu bụ ka anyị ghara ịna-achọ ọdịmma onwe anyị naanị, nakwa ka anyị na-emesapụ aka. Anyị na ndị enyi anyị ga-adị ná mma ma anyị na-emesapụrụ ha aka. Ọ bụrụ na ị na-emere ndị enyi gị ihe n’ebughị n’obi ka ha kwụghachi gị, ndị mmadụ ga-achọ ka ị bụrụ enyi ha.

2. Na-akọrọ Ya Ihe Dị Gị n’Obi

Enyi na enyi agaghị na-adị ná mma ma ọ bụrụ na ha anaghị akọrọ ibe ha ihe. N’ihi ya, na-ekwurịtanụ ihe ọ bụla na-amasị unu. Na-ege enyi gị ntị, na-echebakwara ihe ọ gwara gị echiche. O mee ihe ị ga-eji jaa ya mma, jaa ya mma, na-agbakwa ya ume. Oge ụfọdụ, enyi anyị nwere ike ime ihe anyị ga-eji dụọ ya ọdụ ma ọ bụ baara ya mba, ma ọ naghị adị mfe. N’agbanyeghị na o nwere ike isiri anyị ike, ezigbo enyi kwesịrị ịkata obi gwa enyi ya ihe ọ na-anaghị emeta, gwakwa ya ihe ga-enyere ya aka ịgbanwe.

ỤDỊ ONYE NDỊ MMADỤ NA-ACHỌ IMETE ENYI

Nwoke aha ya bụ Juan kwuru, sị: “Ezigbo enyi kwesịrị ịna-agwa enyi ya obi ya, ma o kwesịghị iwe iwe ma ọ bụrụ na enyi ya ekwetaghị ihe o kwuru.”

Otu nwaanyị aha ya bụ Eunice sịrị: “Ọ na-adị m ụtọ ma ndị enyi m na-abịa m nso mụ na ha ana-ekwurịta ihe ụfọdụ, karịchaa mgbe o nwere ihe na-enye m nsogbu.”

Nwaanyị aha ya bụ Silvina kwuru, sị: “Ezigbo enyi gị ga-agwa gị nke bụ́ eziokwu maka na ọ hụrụ gị n’anya, ọ sọgodị ya ya bụrụ na ọ ma na ihe ahụ ga-ewe gị iwe.”

GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

“Onye ọ bụla aghaghị ịbụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.” (Jems 1:19) Obi na-adị mmadụ mma ma enyi ya na-ege ya ntị. Ọ bụrụ na anyị anaghị ekwe ka enyi anyị tinye ọnụ ma anyị kpawa nkata, ọ na-egosi na anyị chere na ihe anyị na-ekwu ka mkpa karịa ihe ọ bụla ọ chọrọ ikwu. N’ihi ya, na-ege enyi gị ntị ma ọ gwawa gị ihe na-esogbu ya. Iwe ewela gị ma ọ gwa gị eziokwu. Cheta na Ilu 27:6 kwuru, sị “Ọnyá onye hụrụ mmadụ n’anya mepụrụ ya si n’ezi obi.”

 3. Cheta na Enyi Gị Ezughị Okè

Ka anyị na-abịarukwu enyi anyị nso, ka anyị ga-achọpụtakwu ebe ọ naghị emeta. E nweghị onye zuru okè, ma anyị ma ndị enyi anyị. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịna-atụ anya na ndị enyi anyị ga na-emetacha ihe niile. Kama, anyị kwesịrị ịna-aja ha mma n’ebe ha na-emeta ma na-eleghara amaghị eme ha anya.

ỤDỊ ONYE NDỊ MMADỤ NA-ACHỌ IMETE ENYI

Otu nwoke aha ya bụ Samuel sịrị: “Ọ na-abụ mmadụ mejọọ ihe, ya asị na ọ bụ maka na ya ezughị okè, ma ọ ga na-atụ anya ka ndị ọzọ na-emetecha ihe niile. Ọ bụrụ na anyị echeta na anyị na-emejọ ihe nakwa na anyị ga-achọ ka ndị ọzọ gbaghara anyị, ọ gaghị na-esiri anyị ike ịna-agbaghara ndị ọzọ.”

Otu nwoke aha ya bụ Daniel sịrị: “Buru n’obi na ndị enyi gị nwere ihe ndị ha na-agaghị na-emeta. E nwee ihe seere unu okwu, gbalịanụ dozie ya ozugbo. Gbaa mbọ chefuokwa ihe ahụ o mere gị.”

GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

Ị̀ na-agbaghara ndị mejọrọ gị?Ndị Kọlọsi 3:13, 14

“Anyị niile na-asụ ngọngọ ọtụtụ ugboro. Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị asụ ngọngọ n’okwu, ọ bụ onye zuru okè, nke nwere ike ịchịkwa ahụ́ ya dum.” (Jems 3:2) Ọ bụrụ na anyị na-echeta ihe a Baịbụl kwuru, anyị agaghị na-ewere ndị enyi anyị iwe. Ọ ga-enyekwara anyị aka ịna-eleghara amaghị eme ha anya. Ahụ́ agaghị na-agbakasịkwa anyị ma ha mejọọ anyị. Baịbụl kwuru, sị: “Na-ediri ibe unu ihe ma na-agbaghara ibe unu kpamkpam ma ọ bụrụ na onye ọ bụla nwere ihe mere ọ ga-eji mee mkpesa megide ibe ya. . . . Ma, e wezụga ihe ndị a niile, yirinụ ịhụnanya dị ka uwe, n’ihi na ọ bụ ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.”Ndị Kọlọsi 3:13, 14.

 4. Metekwuo Ndị Ọzọ Enyi

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị onye ọ bụla anyị hụrụ, anyị emete ya enyi. Ma, ọ pụtaghị na ọ bụ naanị ndị ọgbọ anyị ma ọ bụ ndị anyị na ha tokọrọ ka anyị ga-emete enyi. Anyị nwere ike imete ma ndị ọgbọ anyị ma ndị anyị tọrọ ma ndị tọrọ anyị enyi. Ndị obodo ọzọ ma ọ bụ ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha nwekwara ike ịbụ ndị enyi anyị. Ọ bụrụ na anyị emete ndị dị iche iche enyi, anyị ga-erite uru buru ibu.

ỤDỊ ONYE NDỊ MMADỤ NA-ACHỌ IMETE ENYI

Otu nwoke aha ya bụ Unai kwuru, sị: ‘Ọ na-abụ a tatụ ụkwa a tatụ akị. N’ihi ya, ọ bụghị naanị ndị ọgbọ gị na ndị na-eme ka gị kwesịrị ịbụ ndị enyi gị.’

Nwaanyị aha ya bụ Funke sịrị: “Ihe nyeere m aka ịghọ mmadụ bụ na ọ bụghị naanị ndị ọgbọ m bụ ndị enyi m. Amụtala m otú mụ na mmadụ ga-esi na-emekọ ihe n’agbanyeghị afọ ole onye ahụ dị ma ọ bụ onye ebe ọ bụ. Ihe a emeela ka mụ na ọtụtụ ndị bụrụ enyi. Otú m si eme na-atọkwa ndị enyi m ụtọ.”

Ị̀ na-emete ndị dị iche iche enyi?2 Ndị Kọrịnt 6:13

GỊNỊ KA BAỊBỤL KWURU?

“Ya mere, iji kwụọ anyị ụgwọ—m na-ekwu dị ka m̀ na-agwa ụmụntakịrị—unu onwe unu, megheenụ obi unu.” (2 Ndị Kọrịnt 6:13) Baịbụl gbara anyị ume ka anyị meghee obi anyị, ya bụ, ka anyị na-emete ndị dị iche iche enyi. Ọ bụrụ na anyị na-emete ndị dị iche iche enyi, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe n’aka ha, ndị mmadụ ga-achọkwa ka anyị na ha bụrụ enyi.

 

GỤKWUO GBASARA YA

Olee Otú E Si Amata Ezigbo Enyi?

Ọ dị mfe mmadụ inweta ndị enyi ọjọọ, ma olee otú ị ga-esi enweta ezigbo enyi?