Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! MEE 2014

 ISIOKWU TETA! A | ÀNỌ M NDỤ EME GỊNỊ?

Ihe Nwere Ike Ịgbanwe

Ihe Nwere Ike Ịgbanwe

“A na-akpagide anyị n’ụzọ niile, ma a kpagideghị anyị nke na anyị enweghị ike imegharị ahụ́; anyị na-enwe mgbagwoju anya, ma ọ bụghị n’enwetụghị ụzọ mgbapụ.”—2 NDỊ KỌRỊNT 4:8.

Ụfọdụ ndị na-ekwu na mmadụ igbu onwe ya maka na nsogbu karịrị ya bịaara ya dị ka ebe mmadụ chọrọ igbupụ isi ya maka na isi na-awa ya. Ọ bụrụgodị na i chere na o nwekataghị ka nsogbu tara ezigbo akpụ hapụ gị aka, ihe nwere ike ịgbanwe mgbe ị na-atụghị anya ya.—Gụọ igbe bụ́  “Ihe Mechara Dịrị Ha Mma.”

Ọ bụrụgodị na ihe agbanweghị, ọ bụghị ichegbu onwe gị ga-ebi ya. Were ụbọchị ọ bụla otú i si hụ ya. Chetakwa na Jizọs sịrị: “Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.”—Matiu 6:34.

Olee ihe ị ga-eme ma ọ bụrụ na nsogbu ahụ bụ nke o nweghị ihe ị ga-emeli ka o bie? Dị ka ihe atụ, gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị na-arịa ọrịa na-enweghị ngwọta, ma ọ bụkwanụ na gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị etisaala, ma ọ bụdị na onye gị nwụrụ?

Ọ sọkwa ya ya dịrị otú ahụ, a ka nwere ihe ị ga-agbanweli. Ị ga-agbanweli otú i si ele nsogbu ahụ anya. Ọ bụrụ na i were ụwa otú i si hụ ya, obi agaghị na-adị gị njọ nke otú ahụ. (Ilu 15:15) Kama ịchọwa ụzọ igbu onwe gị, ihe ị ga na-achọ bụ ụzọ ị ga-esi die ihe bịaara gị. Ò nwere uru ime otú a ga-abara gị? Ee, ọ ga-eme ka ị ghara ịna-eche na e nweghị ihe ọzọ ga-ebi nsogbu gị ma e wepụ ọnwụ.—Job 2:10.

IHE Ị GA-EBURU N’UCHE: Nwayọọ nwayọọ ka e ji aracha ofe dị ọkụ. Nsogbu ọ bụla bịaara gị ga-emecha gafere, ya sọkwa ya ya hara ka elu na ala.

IHE I NWERE IKE IME: Kọtatụrụ nwanne gị ma ọ bụ enyi gị nsogbu gị na ya na-alụ. Onye ahụ nwere ike tụọrọ gị aro ndị ga-enyere gị aka ịgbanwe otú i si ele nsogbu ahụ anya.—Ilu 11:14.