Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! MEE 2014

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Spen

N’afọ 2011, ala ọma jijiji mere na Lọka dị na Spen. Mmadụ itoolu nwụrụ, ebe ọtụtụ ndị ọzọ merụrụ ahụ́. Ndị ọkachamara kwuru na ọ bụ ndị mmadụ kpatara ala ọma jijiji ahụ. Ha chọpụtara na ebe ala ọma jijiji ahụ mere dị nso n’ebe a na-egwu mmiri a na-agba n’ubi kemgbe ọtụtụ afọ.

Chaịna

Ndị si mba dị iche iche, ma Chaịna ma Jamanị ma Amerịka, na-adị na-aga n’obodo ndị ọzọ ka ha gaa legharịa anya. Ego ha na-akwụ maka ụgbọelu na ihe ndị ha na-azụ abụghị obere ego. Ma, ngalaba òtù mba ụwa na-ahụ maka ndị na-aga mba ọzọ kwuru na ego ndị Chaịna mefuru iji gaa mba ọzọ n’afọ 2012 karịrị ego ndị Jamanị na ndị Amerịka mefuru.

Japan

Otu akwụkwọ a na-ede na Briten kwuru na e nwere nchọpụta a malitere ime na Japan kemgbe iri afọ abụọ na atọ gbasara ndị na-ese sịga. A chọpụtara na n’ime ndị a mụrụ n’agbata afọ 1920 na afọ 1945, ọ bụrụ na nwaanyị malitere ise sịga tupu ya eruo afọ iri abụọ anwụọ, nwaanyị ọzọ bụ́ ọgbọ ya na-anaghị ese sịga ga-anọ afọ iri ọzọ tupu ya anwụọ. Ọ bụrụkwanụ nwoke, onye na-anaghị ese sịga ga-anọkwu afọ asatọ ọzọ tupu ya anwụọ.

Mọrịtenia

A chọpụtara na ụmụ anụmanụ na azụ̀ na-anwụ ma ha loo wọtapruf. N’ihi ya, ndị ọchịchị machiri ma ịtụbata wọtapruf ma imepụta ya ma iji ya eme ihe ọ bụla n’obodo a. Ha na-agwa ndị mmadụ ka ha jiri ihe ndị nwere ike ire n’ala na-ekechi ihe.

Ụwa niile

Kwa afọ, ego ndị ụlọ ọrụ ịnshọransị na-emefu ma e nwee ebe ihe dị ka oké ifufe mebiri ihe na-eru ihe dị ka puku ijeri naịra asaa. N’agbanyeghị na e tinyere ego n’ego ahụ a dị ama ama ihe adaa oké ọnụ, kemgbe afọ 1980, ego ahụ na-arị elu okpukpu abụọ n’afọ iri ọ bụla.