Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! SEPTEMBA 2013

 ISIOKWU TETA! A

Ngagharị Iwe Ọ̀ Ga-akwụsị Mmegbu?

Ngagharị Iwe Ọ̀ Ga-akwụsị Mmegbu?

Ọ bụ Ndịàmà Jehova na-ebi akwụkwọ a. Ha anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị. (Jọn 17:16; 18:36) N’isiokwu a, e kwuru banyere ụfọdụ ngagharị iwe ndị mmadụ mere n’obodo dị iche iche. Ma, Ndịàmà Jehova anaghị ekwu na e nwere obodo ka ibe ya mma, ha anaghịkwa eso eme ụdị ngagharị iwe ọ bụla.

O NWERE otu nwa okorobịa onye Tunisha aha ya bụ Mohamed Bouazizi. Ọ dị iri afọ abụọ na isii. Ọ na-ere ahịa mbugharị n’ihi na o nweghị ọrụ. Ihe ọ na-ere bụ ube bekee, unere na apụl. Obi adịghị ya mma n’ihi na ọ ma na aka ọtụtụ ndị na-achị ala ha adịghị ọcha. Ma ike ụwa bịara gwụ ya n’abalị iri na asaa n’ọnwa Disemba afọ 2010. N’ụtụtụ ụbọchị ahụ, ndị uwe ojii buuru ngwá ahịa ya. Ma, o kweghị ka ha buru skel o ji ere ahịa. Ndị nọ mgbe ihe a mere kwuru na ka a na-eme ka a na-eme, otu nwaanyị onye uwe ojii amaa ya ụra.

Ihe a e mere Mohamed were ya ezigbo iwe n’ihi na o weere ya na e menyere ya ihere. N’ihi ya, ọ gara n’otu ụlọ ọrụ gọọmenti dị nso n’ebe ahụ ka ọ gwa ha ihe e mere ya, ma e nweghị onye tụpụụrụ ya ọnụ. E kwuru na mgbe o si n’ụlọ ahụ pụta, o ji oké olu jụọ, sị: “Olee otú unu chọrọ ka m si na-akpa afọ mụ na ezinụlọ m?” Ọ wụrụ onwe ya petrol, mụnye onwe ya ọkụ. O rughị izu atọ ya anwụọ.

Ihe a mere Mohamed Bouazizi wutere ma ndị Tunisha ma ndị obodo ọzọ. Ọtutụ ndị na-ekwu na ọ bụ ihe ahụ mere nwa okorobịa ahụ mere ndị mmadụ ji mee ngagharị iwe ma n’obodo ahụ ma n’obodo ndị ọzọ gbara ya gburugburu. Ndị Omeiwu nke Òtù Jikọtara Mba Ndị Dị na Yurop kwuru na e kwesịrị ịna-echeta Bouazizi na mmadụ anọ ndị ọzọ n’ihi na ha mere ihe ga-eme ka ndị mmadụ nwere onwe ha.

Ihe ahụ mere gosiri na ihe nwere ike gbanwee ma ndị mmadụ gosi na otú ihe si aga n’ọchịchị ma ọ bụ n’obodo ha adịghị ha mma. Ma, gịnị mere ndị mmadụ ji eme ngagharị iwe? È nwere ihe ọzọ ha nwere ike ime kama imewe ngagharị iwe?

 Gịnị Mere Ndị Mmadụ Jizi Emekarị Ngagharị Iwe?

Ihe ndị na-akpatakarị ngagharị iwe bụ:

  • Ọ bụrụ na ndị mmadụ enweghị mmasị n’otú ihe si aga n’obodo ha. Ọ bụrụ na ndị ọchịchị na-achị nke ọma, o nweghị onye a ga-anụ olu ya na ibe ya. E nwegodị ihe ha chọrọ ka e meere ha, ha na ndị ọchịchị na-eji nwayọọ kpaa ya akpa. Ma, ọ bụrụ na ndị mmadụ echee na ndị ọchịchị anaghị akwụwa aka ọtọ nakwa na o nweghị ihe na-erute ha aka, ha nwere ike iji ngagharị iwe gosi na obi adịghị ha mma.

  • E nwee ihe ndị ọchịchị mere mmadụ nke wutere ndị obodo. Ọ bụrụ na e nwere ihe e mere mmadụ ya ewute ndị ọzọ, ndị mmadụ nwere ike ịsị na ha agaghị agbachizi nkịtị, na ha ga-emerịrị ihe iji gosi na ihe ahụ adịghị ha mma. Dị ka ihe atụ, i chetaranụ na ọ bụ ihe ahụ e mere Mohamed Bouazizi mere ndị Tunisha ji malite ime ngagharị iwe. N’India, otu nwaanyị aha ya bụ Anna Hazare jụrụ iri nri iji gosi na obi adịghị ya mma na ndị na-achị obodo ahụ anaghị akwụwa aka ọtọ. Ihe a mere ka ndị òtù ya mee ngagharị iwe na narị obodo anọ na iri ise.

N’oge Sọlọmọn nọ ndụ, o kwuru na ndị mmadụ na-achị ibe ha ọchịchị nchịgbu. (Ekliziastis 8:9) Ma, a na-achịdị ndị mmadụ ọchịchị nchịgbu ugbu a karịa ka ọ dị n’oge ahụ. Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị mmadụ anaghịzi agbachi nkịtị ma ndị ọchịchị chịgbuwe ha. Ịntanet na akụkọ ụwa na-eme ka ndị mmadụ mara ihe na-eme n’ebe dị iche iche n’ụwa, ya sọkwa ya ya bụrụ ihe mere n’ime ime obodo. Akụkọ ndị ahụ nwere ike ime ka ndị nọ n’ebe dị iche iche mewe ngagharị iwe.

Gịnị ka ndị mmadụ na-enweta ma ha mee ngagharị iwe?

Ndị chọrọ ka ndị mmadụ na-eme ngagharị iwe nwere ike ikwu na e nwere uru ọ bara. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike ikwu na:

  • E ji ya nyere ndị ogbenye aka. N’ihe dị ka iri afọ asatọ na atọ gara aga, ọtụtụ ndị enweghị ọrụ n’Amerịka n’ihi na ihe siri ezigbo ike. Ọtụtụ ndị nwe ụlọ n’oge ahụ gwara ndị na-enweghị ike ịkwụ ụgwọ ụlọ ka ha kwapụ n’ụlọ ha. N’ihi ya, ndị mmadụ mere ngagharị iwe na Chikago. Ngagharị iwe ahụ ha mere mere ka ndị ọchịchị kwuo ka a ghara ịchụpụ onye ọ bụla n’ụlọ o bi. Ha nyekwara ụfọdụ ndị ahụ mere ngagharị iwe ọrụ. E mekwara ụdị ngagharị iwe a na Niu Yọk. Nke a mere ka ndị ọchịchị nye iwu ka iri puku ezinụlọ asaa na puku asaa ndị a chụpụrụ n’ụlọ laghachi n’ebe ha bibu.

  • O mere ka a kwụsị mmegbu. N’afọ 1955, ndị uwe ojii Amerịka kpọchiri otu nwaanyị onye isi ojii n’ihi na ọ jụrụ ibiliri onye ọcha n’oche na bọs. N’ihi ya, ndị isi ojii nọ n’Alabama ekweghịzi aba bọs ọ bụla n’obodo ahụ. Nke a mere ka a kagbuo iwu ahụ kwuru na ndị isi ojii ekwesịghị ịnọdụ n’ebe ndị ọcha na-anọ na bọs.

  •   O mere ka a kwụsị ihe a chọrọ ịrụ. N’afọ 2011, a malitere ịrụ ígwè na-enye ọkụ na Họng Kọng. N’ọnwa Disemba afọ ahụ, ọtụtụ ndị mere ngagharị iwe n’ihi na ha kwuru na ihe ahụ a na-arụ ga-emebi ikuku. A kwụsịrị ịrụ ihe ahụ n’ihi ngagharị iwe ahụ e mere.

Mgbe ụfọdụ, e nwere ike meere ndị mmadụ ihe ha kwo mee ngagharị iwe, ma, ọ bụ Alaeze Chineke ga-egboro mmadụ niile mkpa ha

Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụghị mgbe ọ bụla ndị mmadụ mere ngagharị iwe ka a na-emere ha ihe ha chọrọ. Dị ka ihe atụ, ndị ọchịchị nwere ike imesi ndị mmadụ ike ma ha mee ngagharị iwe kama imere ha ihe ha chọrọ. N’oge na-adịbeghị anya, onyeisi ala otu obodo fooro ntutu taa na ya ga-echi ndị na-eme ngagharị iwe n’obodo ahụ ọnụ n’ala. Kemgbe ahụ, e gbuola ọtụtụ ndị n’obodo ahụ.

Ọ bụrụgodị na e meere ndị mmadụ ihe ha ji maka ya mee ngagharị iwe, nsogbu ọzọ nwere ike ịpụta. N’otu obodo dị n’Afrịka, otu nwoke so chụtuo onyeisi ala ha mechara gwa ndị nta akụkọ na ihe ha hụrụ wee kwado ọchịchị ọhụrụ abụghịzi ihe ha na-ahụ ugbu a.

È nwere ihe ọzọ e nwere ike ime kama imewe ngagharị iwe?

Ọtụtụ ndị a ma ama na-ekwu na ndị mmadụ kwesịrị ịna-eme ngagharị iwe. Dị ka ihe atụ, onye bụbu onyeisi ala Chek aha ya bụ Václav Havel nọrọ mkpọrọ ọtụtụ afọ n’ihi na ọ na-agbachitere ndị a na-emegbu emegbu. N’afọ 1985, o dere na ndị na-eme ngagharị iwe ga-adị njikere ime ihe ọ bụla ha nwere ike iji gosi otú obi dị ha, ọ bụrụgodị na ime ngagharị iwe ga-ata isi ha. Ihe ha ji eme otú a bụ na o nweghị  ihe ọzọ ha ma ha ga-eme iji nweta ihe ha chọrọ.

Ihe ahụ Mohamed Bouazizi na ndị ọzọ mere gosiri na ha kwetara ihe ahụ Havel kwuru. N’otu obodo dị n’Eshia, ọtụtụ ndị na-amụnye onwe ha ọkụ iji gosi na obi adịghị ha mma na ndị ọchịchị anaghị ekwe ha kpee okpukpe dị ha mma, ma ọ bụkwanụ kwe ka ha kwado òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ. Mgbe ndị nta akụkọ jụrụ otu nwoke ihe mere ndị mmadụ ji egbu onwe ha iji gosi na ihe a na-eme adịghị ha mma, o kwuru, sị: “Anyị enweghị égbè, anyị achọghịkwa imerụ ndị ọzọ ahụ́. O nweghị ihe ọzọ anyị ma anyị ga-eme.”

Baịbụl gwara anyị otú a ga-esi kwụsị imegbu ndị mmadụ na ịchị ha ọchịchị nchịgbu. O kwuru na Alaeze Chineke ga-anọchi ọchịchị ụmụ mmadụ. Ị manụ na ọ bụ otú ndị mmadụ si achị ibe ha na-eme ka ndị obi na-adịghị mma mewe ngagharị iwe. Baịbụl kwuru banyere Onye ga-achị alaeze ahụ, sị: “Ọ ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka, nakwa onye nọ n’ahụhụ na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-anapụta mkpụrụ obi ha ná mmegbu nakwa n’ihe ike.”—Abụ Ọma 72:12, 14.

Ndịàmà Jehova kwetara na ọ bụ naanị Alaeze Chineke ga-eme ka ihe dị mma. (Matiu 6:9, 10) N’ihi ya, ha anaghị eso eme ngagharị iwe. Ma, ọ̀ dị gị ka Alaeze Chineke agaghị enwe ike iwepụ ihe ndị na-eme ka ndị mmadụ na-eme ngagharị iwe? I nwere ike iche otú ahụ. Ma, e nwere ọtụtụ ndị kwetasiri ike na Alaeze Chineke ga-egbo mkpa mmadụ niile. Ọ ga-adị mma ka ị chọpụta ihe mere ha ji kweta.