Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! JULAỊ 2013

 AJỤJỤ ỌNỤ | RACQUEL HALL

Otú Otu Nwaanyị Si Kwụsị Ikpe Okpukpe Ndị Juu

Otú Otu Nwaanyị Si Kwụsị Ikpe Okpukpe Ndị Juu

O nwere otu nwaanyị aha ya bụ Racquel Hall. Mama ya bụ onye Izrel, na-ekpekwa okpukpe ndị Juu. Papa ya abụrụ onye Ọstria, mechaakwa kpewe okpukpe ndị Juu. Nne nne ya na nna nne ya nọ n’òtù na-ahụ na e nweghachiri mba Izrel. Ha bịara biri n’Izrel n’afọ 1948. Ọ bụkwa n’afọ ahụ ka Izrel nke ugbu a malitere. Ndị na-ede Teta! jụrụ Racquel ihe mere o ji kwụsị ikpe okpukpe ndị Juu. Lee ihe ọ gwara ha.

Gịnị ka ị ga-agwatụ anyị gbasara onwe gị?

A mụrụ m n’Amerịka n’afọ 1979. Papa m na mama m gbara alụkwaghịm mgbe m dị afọ atọ. Ma, mama m kpọọrọ m. Ọ kụziiri m omenala ndị Juu, tinyekwa m n’ụlọ akwụkwọ a na-anọ azụ ndị Juu. Mgbe m dị afọ asaa, anyị gara biri n’Izrel. Anyị nọrọ n’ebe ahụ otu afọ. Mgbe ahụ anyị bi n’ebe ahụ, m na-aga akwụkwọ n’ebe ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu na-aga akwụkwọ. Mụ na mama m mechakwara gaa biri na Meksiko.

E nweghị ụlọ okpukpe ndị Juu n’ebe anyị bi, ma ahapụghị m omenala ndị Juu. M na-amụnye kandụl n’Ụbọchị Izu Ike ọ bụla, na-agụkwa akwụkwọ ndị okpukpe anyị. M chọọ ikpe ekpere, mụ agaa buru akwụkwọ ekpere na-agụ. M gaa akwụkwọ, ihe m na-agwakarị ụmụ akwụkwọ ibe m bụ na okpukpe ndị Juu ka okpukpe ndị ọzọ mma. N’oge ahụ, anaghị m agụ Agba Ọhụrụ n’ihi na ọ bụ na ya ka e dere otú Jizọs si jee ozi nakwa ihe ndị ọ kụziri. Ọ bụ mama m gwara m ka m ghara ịgụ ya n’ihi na ọ ga-eduhie m.

Gịnị mere i ji malite ịgụ Agba Ọhụrụ?

Mgbe m dị afọ iri na asaa, alaghachiri m Amerịka ka m gaa gụchaa akwụkwọ. N’ebe ahụ, otu nwa akwukwọ anyị sị na ya bụ Onye Kraịst gwara m na ndụ m agaghị enwe isi ma ọ bụrụ na mụ ekweghị na Jizọs.

“M gwara ya na o nweghị onye ọ bụla ma ihe ga-ekwe na Jizọs.

Ọ jụrụ m ma ò nwetụla mgbe m gụrụ Agba Ọhụrụ.

Mụ asị ya mba.

Ya asị m: “Ọ bụrụ otú ahụ, í cheghị na ị na-ekwu ihe na-edoghị gị anya?”

 Ihe a o kwuru ruru m n’ahụ́ n’ihi na m na-ekwukarị na onye ọ bụla na-ekwu ihe na-edoghị ya anya bụ onye iberiibe. N’ihi ya, m weere Baịbụl ya laa n’ụbọchị ahụ, malitekwa ịgụ Agba Ọhụrụ.

Olee otú ihe ị gụtara si nyere gị aka?

Ị̀ makwa na amabughị m na ọ bụ ndị Juu dere Agba Ọhụrụ? Ọ bụ mgbe m bidoro ịgụ ya ka m chọpụtara na ọ bụ ha dere ya. Ihe ọzọ bụ na m bịara chọpụta na Jizọs bụ onye Juu, nakwa na o nwere obiọma, dịrịkwa umeala n’obi. Achọpụtakwara m na o nyeere ndị mmadụ aka, o nweghị mgbe o megburu ha. A gadịrị m n’ọ́bà akwụkwọ were akwụkwọ ndị kwuru banyere Jizọs gụọ. Ma, o nweghị nke mere ka o doo m anya na ọ bụ yanwa bụ Mesaya. Ụfọdụ n’ime ha kwudịrị na Jizọs bụ Chineke. Ma, ama m na ọ bụghị eziokwu. Baịbụl kwuru na Jizọs kpegaara Chineke ekpere. A sị na Jizọs bụ Chineke ọ pụtaranụ na ọ bụ onwe ya ka o kpegaara ekpere. Ihe ọzọ bụ na Jizọs mechara nwụọ mgbe ọ bịara n’ụwa, ma Baịbụl kwuru na Chineke anaghị “anwụ anwụ.” *

Olee otú i si mata nke bụ́ eziokwu?

Ị manụ na eziokwu anaghị emegide onwe ya. M bịara kpebie na m ga-achọpụta nke bụ́ eziokwu. N’ihi ya, ekpegara m Chineke ekpere. Na nke ugbu a, ejighị m akwụkwọ ekpere, o si m n’obi. O teghị aka m kpechara ekpere ahụ, mmadụ akụọ aka n’ụzọ m. Mgbe m meghere ụzọ, ahụrụ m Ndịàmà Jehova abụọ. Ha nyere m akwụkwọ ha ji amụ Baịbụl, mụ na ha ana-amụkwa ya. Nke a mere ka m kweta na ihe ndị ha na-akụziri m si na Baịbụl. Dị ka ihe atụ, Ndịàmà Jehova kweere na Jizọs bụ “Ọkpara Chineke,” * ọ bụghị atọ n’ime otu. Ha kwekwara na ọ bụ onye mbụ Chineke kere. *

Ọ dịghị anya mụ na Ndịàmà Jehova mụwara ihe, mụ alaghachi Meksiko. Mgbe m ruru ebe ahụ, mụ na ha bidokwara na-amụ amụma ndị kwuru gbasara Mesaya. Obi dị m ụtọ mgbe m chọpụtara na o nwere ọtụtụ amụma kwuru gbasara Mesaya. Ma, m ka nọ na-enwe obi abụọ. M bịara na-eche ma ọ̀ bụkwa naanị Jizọs ka ihe ndị e kwuru gbasara Mesaya mezuru n’isi. M chekwara na o nwere ike ihe Jizọs kwo mee ihe ndị o mere bụ ka ndị mmadụ chee na ọ bụ yanwa bụ Mesaya.

Gịnịzi mere i ji kweta na Jizọs bụ Mesaya?

Ndịàmà Jehova ahụ gosiri m amụma ndị ọzọ. Onye ọ bụla nụrụ gbasara ha ga-ama na o nweghị onye ga-ejili aka ya mee ka ha mezuo n’isi ya. Dị ka ihe atụ, ihe karịrị narị afọ asaa tupu a mụọ Mesaya, Maịka onye amụma kwuru na a ga-amụ ya na Betlehem nke Judia. * O nweghị onye n’ime anyị ga-eji aka ya kwuo ebe a ga-amụ ya. Aịzaya bukwara amụma na Mesaya ga-anwụ ọnwụ ihere ka onye ohi. O kwukwara na a ga-eli ya n’ebe a na-eli ndị ọgaranya. * Ọ bụ naanị n’isi Jizọs ka ihe a niile mezuru.

Ihe ikpeazụ ha gwara m bụ gbasara ezinụlọ Jizọs si. Baịbụl kwuru na Mesaya ga-esi n’ezinụlọ Eze Devid. * N’oge ochie, ndị Juu na-edekarị ezinụlọ mmadụ si n’akwụkwọ. A sị na Jizọs esighị n’ezinụlọ Devid, ndị iro ya gaara ekwu ya. Ma, o nweghị mgbe ha kwuru na ọ bụghị eziokwu n’ihi na a naghị enyo ya enyo. Ndị mmadụ kpọdịrị ya “Nwa Devid.” *

Mgbe Jizọs nwụrụ, ihe dị ka afọ iri atọ na asaa agaakwa, ndị agha Rom bịara bibie Jeruselem. Ihe a mere n’afọ 70 Oge Ndị Kraịst. Nke a pụtara na Mesaya ga-abịarịrị tupu e bibie Jeruselem. Ihe mere m ji kweta ya bụ na akwụkwọ ndị ahụ e dere ezinụlọ ndị Juu furu mgbe ahụ e bibiri Jeruselem. A sị na Mesaya ahụ abịaghị tupu mgbe ahụ, o nweghị otú a gaara esi ama ezinụlọ o si.

Olee ihe i mere mgbe ị matara ihe a niile?

At Deuteronomy 18:18, 19, it was foretold that God would raise up iDiuterọnọmi 18:18, 19 kwuru na Chineke ga-esi n’Izrel họpụta otu onye amụma ga-adị ka Mozis. Chineke kwukwara, sị: “Onye na-egeghị ntị n’okwu m ndị ọ ga-ekwu n’aha m, mụ onwe m ga-emekwa ka ọ zaa ajụjụ maka ya.” Otú m si mụọ ma Agba Ochie ma Agba Ọhụrụ nke ọma mere ka o doo m anya na ọ bụ Jizọs onye Nazaret bụ onye amụma ahụ.