Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! JULAỊ 2013

 IHE BAỊBỤL KWURU

Ụdị Onye Chineke Bụ

Ụdị Onye Chineke Bụ

Chineke ọ̀ dị ka anyị?

“Chineke bụ Mmụọ.”—Jọn 4:24.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na Chineke bụ mmụọ. (2 Ndị Kọrịnt 3:17) N’ihi ya, ọ ka anyị. Anyị agaghị ahụli ya anya. 1 Timoti 1:17 kwuru na ọ bụ “Eze mgbe ebighị ebi, onye a na-apụghị ibibi ebibi, onye a na-apụghị ịhụ anya.” Baịbụl kwukwara na “ọ dịghị mgbe onye ọ bụla hụtụworo Chineke.”—1 Jọn 4:12.

Chineke abụghị mmadụ. N’ihi ya, anyị agaghị ekwuli otú ọ dị. Aịzaya 40:18 kwuru, sị: “Ònye ka unu pụrụ iji Chineke tụnyere, oleekwa ihe unu pụrụ ịsị na o yiri?” Ihe niile dị n’eluigwe dị egwu. Ma, a gaghị eji ha tụnyere Chineke.—Aịzaya 40:22, 26.

Ma, e nwere ndị nọ n’eluigwe. Ha na-ahụ Chineke anya, na-agwakwa ya okwu n’ihi na ha bụkwa mmụọ. (1 Ndị Eze 22:21; Ndị Hibru 1:7) A na-akpọ ha ndị mmụọ ozi. Jizọs Kraịst kwuru banyere ha, sị: “[Ha] na-ahụ ihu Nna m nke bi n’eluigwe mgbe niile.”—Matiu 18:10.

 Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?

“Ya mere, kpeenụ ekpere otú a: ‘Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ.’”—Matiu 6:9.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl ekwughị na Chineke nọ n’ebe niile. Kama ihe Jizọs kwuru na Matiu 6:9 na 18:10 gosiri na Chineke nwere ahụ́. Ọ bụ “Nna,” birikwa n’eluigwe. Ebe ahụ bụ ‘ebe obibi ya guzosiri ike.’—1 Ndị Eze 8:43.

Mgbe ọ fọrọ obere ka Jizọs jechaa ozi o kwo bịa n’ụwa, o kwuru, sị: “Ana m ahapụkwa ụwa, ana m alakwuru Nna m.” (Jọn 16:28) Mgbe ọ nwụrụ, Chineke kpọlitere ya n’ọnwụ, ya aghọọ mmụọ. “Ọ banyere n’ime eluigwe, ka o wee pụta ugbu a n’ihu Chineke n’onwe ya maka anyị.”Ndị Hibru 9:24.

Gịnị mere anyị kwesịrị iji chebara ihe ndị a anyị kwuru echiche? Ebe ọ bụ na Chineke dị, anyị nwere ike ịmụ gbasara ya, bịaruokwa ya nso. (Jems 4:8) Ihe ọzọ bụ na anyị mata nke bụ́ eziokwu gbasara Chineke, ọ ga-enyere anyị aka ife ya otú ọ chọrọ. Anyị agaghị eji ihe ndị a kpụrụ akpụ na-efe ya. 1 Jọn 5:21 kwuru, sị: “Ụmụntakịrị, kpacharanụ anya ka unu ghara ikpere arụsị.”

Olee otú o si bụrụ na Chineke kere anyị n’onyinyo ya?

“Chineke wee kee mmadụ n’onyinyo ya, ọ bụ n’onyinyo Chineke ka o kere ya; nwoke na nwaanyị ka o kere ha.”—Jenesis 1:27.

IHE BAỊBỤL KWURU

Anyị nwere ike ịmụta àgwà Chineke. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịmụta ịhụnanya na ikpe ziri ezi n’aka ya. Anyị nwekwara ike inwe amamihe. Baịbụl kwuru, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya.”—Ndị Efesọs 5:1, 2.

Chineke kekwara anyị ka anyị jiri aka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Nke a na-enyere anyị aka ime ihe dị mma kama ime ihe ọjọọ. Ọ na-enyekwara anyị aka ịhụ ndị ọzọ n’anya. (1 Ndị Kọrịnt 13:4-7) Ihe ọzọ bụ na anyị nwere ike iji ọgụgụ isi anyị rụpụta ihe. Anyị hụkwa ihe ndị mara mma Chineke kere, obi na-adị anyị ụtọ, anyị ana-etokwa ya. Chineke kere anyị ka anyị na-efe ya, na-emekwa ihe ọ chọrọ.—Matiu 5:3.

Otú ihe Baịbụl kwuru nwere ike isi baara anyị uru. Ọ bụrụ na anyị ana-amụ gbasara Chineke ma na-eme ka ya, ọ ga-enyere anyị aka ịna-ebi ndụ dị mma. Nke a ga-eme ka obi na-atọkwu anyị ụtọ, ahụ́ eruokwa anyị ala. (Aịzaya 48:17, 18) Chineke ma na àgwà ya na-atọ anyị ụtọ. Àgwà ya na-eme ka ya na ndị chọrọ ịmụta banyere ya dịrị ná mma, bụ́kwanụ nke ga-eme ka ha dịrị ndụ ebighị ebi.—Jọn 6:44; 17:3.