Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! MEE 2013

 IHE BAỊBỤL KWURU

Ile Ndị Gba Ọtọ

Ile Ndị Gba Ọtọ

Baịbụl Ò Kwuru na Ile Ndị Gba Ọtọ Adịghị Mma?

“Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.”—Matiu 5:28.

IHE MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI CHEBARA YA ECHICHE

Ọtụtụ ụmụaka taa na-ele ndị gba ọtọ. Ọtụtụ ndị torola eto na-elekwa ha. E nwekwara ọtụtụ ebe mmadụ nwere ike ịga lee ndị gba ọtọ ma ọ bụ gụọ gbasara ha. Ọ bụrụ na ị chọrọ ka obi dị ma Chineke ma gịnwa ụtọ, i kwesịrị ịma otú Chineke si were ile ndị gba ọtọ.

IHE BAỊBỤL KWURU

O nweghị ebe Baịbụl kwuru na ile ndị gba ọtọ adịghị mma. Ma, o nwere ọtụtụ ihe Baịbụl kwuru ndị gosiri na ile ndị gba ọtọ bụ ihe ọjọọ.

Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na nwoke ji nwaanyị ‘na-ele onye na-abụghị nwunye ya anya,’ ya agụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, o nwere ike ime ka ọ kwaa iko. Ihe a Baịbụl kwuru gbasara ma ndị lụrụla di na nwunye ma ndị na-alụbeghị. Chineke kpọrọ ile ndị gba ọtọ asị. Mmadụ ekwesịghị ịna-ele ndị gba ọtọ n’ihi na ọ ga-eme ka agụụ inwe mmekọahụ gụwa ya.

 Ò nwere ihe o mere ma ọ bụrụ na mmadụ na-ele ndị gba ọtọ ma ọ naghị akwa iko?

“Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu . . . nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ, ọchịchọ ọjọọ, na anyaukwu, nke bụ́ ikpere arụsị.”—Ndị Kọlọsi 3:5.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-eme nnyocha na-ekwu na ile ndị gba ọtọ agaghị eme ka mmadụ kwaa iko. Ma, ì chere na ile ndị gba ọtọ bụ ihe ọjọọ n’anya Chineke ma onye na-ele ya ọ̀ kwara iko ma ọ bụ na ọ kwaghị?

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru na “okwu njakịrị rụrụ arụ” adịghị mma. (Ndị Efesọs 5:3, 4) Ọ bụrụ na okwu njakịrị rụrụ arụ bụ ihe ọjọọ, í cheghị na ile ndị gba ọtọ ga-aka ya njọ? Taa, a na-egosi ebe nwoke na nwaanyị na-enwe mmekọahụ, ebe nwoke na nwoke ma ọ bụ nwaanyị na nwaanyị na-enwe mmekọahụ, nakwa ụdị mmekọahụ ndị ọzọ rụrụ arụ. Ile ebe a na-eme ihe ndị a dị njọ n’anya Chineke. Ọ kpọdịrị ya asị karịa ịma njakiịrị rụrụ arụ.

Ndị na-eme nnyocha ka na-ekwusi ya ike na ile ndị gba ọtọ enweghị ihe ọ ga-eme mmadụ. Ma, Baịbụl kwuru na ile ndị gba ọtọ na-eme ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma. Chineke kpọrọ ya asị. Baịbụl kwuru, sị: “Ya mere, meenụ ka akụkụ ahụ́ unu . . . nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko [na] agụụ mmekọahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:5) Ndị na-ele ndị gba ọtọ anaghị eme ihe a Baịbụl kwuru. Ha na-ele ihe ndị ga-eme ka ha na-eche otú ha ga-esi kwaa iko, ọ bụghị ihe ndị ga-eme ka ha wepụ obi ha na ya.

Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-ele ndị gba ọtọ?

‘Chọọ ezi ihe, ọ bụghị ihe ọjọọ. Kpọọ ihe ọjọọ asị, hụkwa ezi ihe n’anya.’—Emọs 5:14, 15.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl kwuru gbasara ndị na-akwabu iko, ndị bụbu ndị aṅụrụma na ndị ohi. Ma, ha emechaa kwụsị àgwà ọjọọ ndị a. (1 Ndị Kọrịnt 6:9-11) Gịnị nyeere ha aka ịkwụsị ha? Ha mere ihe ha mụtara na Baịbụl. Nke a nyeere ha aka ha akpọọ ihe ọjọọ asị.

Ndị na-ele ndị gba ọtọ ga-akwụsịli ya. Ihe ga-enyere ha aka bụ ichebara ihe ọjọọ ndị ọ na-akpata echiche. Otu nnyocha a nọ n’otu mahadum dị n’Amerịka mee n’oge na-adịbeghị anya gosiri na obi anaghị adịkarị ndị na-ele ndị gba ọtọ mma. Ha anaghị achọkarị ịnọ ebe ndị ọzọ nọ. Ha na di ha ma ọ bụ nwunye ha na-esekarịkwa okwu. Anyị kwuru na mbụ na Chineke kpọrọ ile ndị gba ọtọ asị. N’ihi ya, ọ na-eme ka onye na-ele ha na Chineke ghara ịdị ná mma. Ị manụ na ọ bụ nke a kacha ihe ọjọọ niile ọ na-akpata njọ.

Baịbụl ga-enyere anyị aka ịna-ele ihe ndị ga-abara anyị uru. Anyị na-agụ Baịbụl, anyị ga na-achọ ime ihe anyị na-agụta na ya. Nke a ga-emekwa ka anyị kpọọ ile ndị gba ọtọ asị. Ọ ga-emekwa ka anyị kwuo ụdị ihe a Devid kwuru. Ọ sịrị: “Agaghị m edebe ihe ọ bụla na-abaghị uru n’ihu m.”—Abụ Ọma 101:3.