Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! MACH 2013

 ISIOKWU TETA! A

Ihe Mere Ndị Mmadụ Ji Aga Ala Ọzọ Na Otú Ihe Na-adị ma Ha Ruo

Ihe Mere Ndị Mmadụ Ji Aga Ala Ọzọ Na Otú Ihe Na-adị ma Ha Ruo

Ha Na-achọ Ebe Ihe Ga-adịrị Ha Mma

O NWERE otu nwoke aha ya bụ George. Nwoke a nọ na-achọsi ọrụ ike. Ihe ọ na-akpata anaghị ezuru ya na ezinụlọ ya. N’obodo ha, ọtụtụ ndị na-arịakarị ọrịa, e nwekwara ndị nke na-anaghị ahụ tụrụ rachaa. Ma, e nwere otu obodo na-adịchaghị anya n’obodo ha. Ihe dị mma n’obodo ahụ karịa n’obodo ha. George kpebiri na ya ga-aga biri n’ebe ahụ. Ọ sịrị: ‘M ruo, mụ achọrọ ọrụ rụwa. E mechaa, mụ abịa kpọrọ nwunye m na ụmụ m.’

E nwere nwaanyị Naịjirịa aha ya bụ Patricia. Ọ chọrọ ịga biri n’obodo ọzọ n’ihi na ihe na-esiri ya ike. O nweghị ọrụ ọ na-arụ na Naịjirịa, inweta ọrụ ga-esikwara ya ike. N’ihi ya, ya na enyi ya nwoke hapụrụ Naịjirịa gawa Ọljirịa. Ha bu n’obi na ha ga-esizi ebe ahụ gafee Spen. Ma, ha amaghị na ịgafe Ọzara Sahara abụghị obere okwu. Patricia kwuru, sị: “Adị m ime n’oge ahụ. Agwakwara m onwe m na agaghị m ekwe ka nwa m taa ahụhụ.”

Onye ọzọ si n’obodo ya gaa obodo ọzọ bụ Rachel. Ọ bụ onye Filipinz ma o si ebe ahụ kwaga Yurop n’ihi na ihe na-esiri ya ike. Mgbe ọ nọ Filipinz, ọ na-arụ ọrụ, e mechaa chụọ ya n’ọrụ. Ndị ikwu ya gwara ya na e nwere ọtụtụ ndị na-achọ onye ga-agbara ha odibo na Yurop. N’ihi ya, ọ gara biri ego, jiri ya gbaa ụgbọelu gawa Yurop, hapụ di ya na nwa ya na Filipinz. Mgbe ọ na-apụ, ọ gwara ha na ya agaghị anọ ọdụ bịa kpọrọ ha.

Na nso nso a, ihe dị ka narị nde mmadụ abụọ akwagala obodo ọzọ otú ahụ George, Patricia, na Rachel si kwaga. Mgbe ụfọdụ, agha, ọdachi ma ọ bụkwanụ mmegbu na-eme ka ndị mmadụ si obodo ha kwaga obodo ọzọ. Ma, ọtụtụ ndị na-akwaga obodo ọzọ ka ha nwee ike ịkpatakwu ego. Olee nsogbu ndị ha na-enwe n’ebe ha kwagara? Ọ̀ bụ ha niile ka ihe na-agara otú ha si tụọ anya ya? Olee otú obi na-adị ụmụaka ma papa ha ma ọ bụ mama ha hapụ ha gaa biri n’obodo ọzọ? A zara ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

 Ahụhụ Ha Na-ata N’ụzọ Na Nke Ha Na-ata Ma Ha Ruo

Nsogbu mbụ ndị na-aga biri n’obodo ọzọ na-enwe bụ na ahụhụ ha na-ata n’ụzọ enweghị atụ. Ị manụ na anyị kwuru gbasara George n’isiokwu bu nke a ụzọ. Mgbe o si obodo ya na-akwaga obodo ọzọ, ọ gbara ọtụtụ narị kilomita tupu ya eruo ebe ahụ. Nri o bu gaa ehighịkwa nne. O kwuru, sị: “Ahụhụ m tara n’ụzọ abụghị ihe e ji ọnụ akọ.” Ọtụtụ ndị na-akwaga mba ọzọ na-anwụdị n’ụzọ.

Onye ọzọ anyị kwuru okwu ya bụ Patricia. O kpebiri na o nweghị ihe ga-eme ka ya ghara iru Spen. Ọ gbara ụgbọala elu ya ghe oghe na Naịjirịa, ya eburu ya si Ọzara Sahara rute Ọljirịa. O kwuru, sị: “Anyị dị mmadụ iri abụọ na ise n’obere ụgbọala ahụ. O were anyị otu izu iji si Naịjirịa ruo Ọljirịa. N’ụzọ, anyị hụrụ ebe ozu ndị mmadụ ghasachara, hụkwa ndị tọrọ n’ọzara ahụ. Ọ ga-abụ na ndị kwọ ha hapụrụ ha gawa.”

Onye ọzọ anyị kwukwara okwu ya bụ Rachel. Otú o si kwaga obodo ọzọ dị iche n’otú George na Patricia si kwaga. Ọ gbara ụgbọelu gawa Yurop, bụ́ ebe ọ ga na-agbara ndị mmadụ odibo. Ma, ọ maghị na obi ga na-ajọ ya njọ ma ya cheta nwa ya nwaanyị dị afọ abụọ ọ hapụrụ n’ụlọ. O kwuru, sị: “Obi na-ajọ m njọ mgbe ọ bụla m hụrụ nwaanyị ku nwa ya.”

Ọ rara ahụ́ tupu ebe ahụ George gara amara ya ahụ́. Ọ nọkwara ọdụ tupu ya ezitewere nwunye ya ego. O kwuru, sị: “Ọtụtụ mgbe, m na-ebe ákwá n’abalị n’ihi na enweghị m onye m na-ekwusara okwu. Ike ụwa gwụkwara m.”

Mgbe Patricia nọrọ ọtụtụ ọnwa n’Ọljirịa, ọ gara nọrọ n’ókè Ọljirịa na Moroko. O kwuru, sị: “Ọ bụ n’ebe ahụ ka m nọ mụọ nwa m nwaanyị. M na-ezogharị ka ndị na-anwụde ụmụ nwaanyị ndị bịara abịa n’obodo ahụ ghara ịhụ m. Ha hụ m, ha ga-akpụrụ m kpụnye ndị m ga-aga gbawara akwụna. Emechara m nweta ego m ji gbaa ụgbọ mmiri gawa Spen. Ụgbọ mmiri ahụ adịghị mma, ndị o bu karịkwara akarị. Anyị ji akpụkpọ ụkwụ anyị na-ekupụ mmiri na-abata na ya. Mgbe anyị ruru Spen, ike ọ bụla adịghị m isi n’ikpere mmiri ụgbọ ahụ kwụsịrị anyị gbagote n’elu ala.”

Ndị bu n’obi ịga biri n’obodo ọzọ kwesịrị icheta ahụhụ ndị ha ga-ata n’ụzọ. Ihe ọzọ ha ga-eburu n’obi bụ na ịmụta asụsụ ndị ebe ahụ na omenala ha agaghị adịrị ha mfe. Ha kwesịkwara icheta na ha ga-emefu ego hiri nne tupu ha aghọọ ụmụ amaala obodo ahụ ma ọ bụkwanụ e nye ha akwụkwọ ka ha nọrọwa. Ọ na-esi ike tupu ndị na-enweghị akwụkwọ ahụ enweta ezigbo ọrụ ma ọ bụkwanụ ezigbo ụlọ ha ga-ebi. Ha enweghịkwa ike ịga akwụkwọ n’ebe ahụ. Ha rịawakwa ọrịa, ọ na-esi ike inweta ụlọ ọgwụ ga-ekwe agwọ ha. Ihe ọzọ bụ na ọ na-ara ahụ́ e nye ha akwụkwọ ikike e ji akwọ ụgbọala ma ọ bụ kwe ka ha tinye ego n’ụlọ akụ̀. A na-emegbukarịkwa ha, a naghị akwụ ha ezigbo ụgwọ ma ha rụọ ọrụ.

Ihe ọzọ onye chọrọ ịkwaga mba ọzọ ga-eburu n’uche bụ ihe Baịbụl kwuru gbasara ego. Anyị ekwesịghị ịtụkwasị ego obi. Baịbụl kwuru, sị: “Adọgbula onwe gị n’ọrụ inweta akụnụba. Kwụsị ịdabere ná nghọta gị. Ì legidewo ya anya, n’agbanyeghị na o nweghị  ihe ọ bụ? N’ihi na ọ na-emere onwe ya nku dị ka nke ugo wee fepụ chee ihu n’eluigwe.” (Ilu 23:4, 5) Cheta na ego agaghị azụtali ịhụnanya. Ọ gaghị emeli ka obi ruo anyị ala. Ọ bụghịkwa ya ga-eme ka anyị na ndị ezinụlọ anyị dịrị ná mma. Ị manụ na ihe ndị a dị anyị ezigbo mkpa. Ọ gaghị adị mma ma nwoke kworo ego hapụ nwunye ya gaa biri n’obodo ọzọ. Ọ gaghịkwa adị mma ma nwaanyị mee otú ahụ. Nne ma ọ bụ nna ekwesịghịkwa ikwe ka ego mee ka ọ nọrọ n’obodo ọzọ, ụmụ ya anọrọ n’ọzọ.—2 Timoti 3:1-3.

Anyị niile kwesịkwara ịna-amụ gbasara Chineke. (Matiu 5:3) N’ihi ya, ndị nne na nna hụrụ ụmụ ha n’anya na-agba mbọ kụziere ha Okwu Chineke. Ha na-akụzikwara ha ihe Chineke bu n’obi imere anyị, nakwa ihe ndị ọ chọrọ ka anyị na-eme.—Ndị Efesọs 6:4.

 Ezinụlọ Ibikọ Ọnụ Ka Ego Mkpa

Ọ bụrụ na a gbaa ndị niile na-akwaga obodo ọzọ ajụjụ ọnụ, onye nke ọ bụla n’ime ha ga-akọ akụkọ nke ya. Ma, ọ bụ otu ihe na-esi na ha niile apụta. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ ndị ahụ anyị kọrọ akụkọ ha n’isiokwu abụọ bu nke a ụzọ. Ihe a kọrọ banyere ha gosiri na ezinụlọ na-ata ahụhụ ma nna nwe ụlọ ma ọ bụ nwunye ya hapụ ụlọ kwaga obodo ọzọ. Ọtụtụ afọ nwekwara ike ịga tupu ya na ndị ezinụlọ ya ahụ anya ọzọ. I chetaranụ na anyị kọrọ gbasara George, Rachel, na Patricia. Ọ karịrị afọ anọ tupu nwunye George na ụmụ ha ahụ ya anya ọzọ.

Rachel mechara gaa kpọrọ nwa ya nwaanyị na Filipinz. Ma, ọ fọrọ obere ka o ruo afọ ise tupu ya agaa kpọrọ ya. Patricia ku nwa ya ahụ rute Spen. O kwuru, sị: “M gbalịrị na-elezi ya anya n’ihi na ọ bụ naanị ya ka mụ na ya bi.”

Ọtụtụ ndị na-akwaga obodo ọzọ anaghị ekwe alaghachi obodo ha n’agbanyeghị na ha anaghị ahụ onye ha ga na-ekwusara okwu, ihe na-esiri ha ike, ha anaghịkwa ahụ ndị ezinụlọ ha anya ruo ọtụtụ afọ. Ọ bụrụ na ihe agaghị otú ha tụrụ anya ya, ihere anaghị ekwe ha laghachi obodo ha. Ọ bụ naanị mmadụ ole na ole n’ime ha na-akata obi laghachi.

Otu n’ime ndị katara obi laghachi obodo ha bụ Allan onye Filipinz. Mgbe ọ gara Spen, o nwetara ezigbo ọrụ. Ma, mgbe ọnwa iri na asatọ gara, ọ gbara arụkwaghịm laghachi Filipinz. O kwuru, sị: “Mgbe ahụ m nọ Spen, m na-eche mgbe niile gbasara nwunye m na nwa anyị nwaanyị. N’ihi ya, ekpebiri m na o nweghị ihe ọzọ ga-eme ka m kworo ọrụ gawa obodo ọzọ, ọ gwụkwala ma anyị niile ò so gawa. Ọ bụ ya ka anyị mechara mee. Ezinụlọ m ka ego mkpa.”

E nwere ihe ọzọ Patricia chọpụtara na ọ ka ego mkpa. Mgbe ọ na-aga Spen, o weere Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst ma ọ bụ nke ndị mmadụ na-akpọ “Agba Ọhụrụ.” O kwuru, sị: “Eji m ya mere ọtụmọkpọ. Ma, ọ dịghị anya otu nwaanyị Onyeàmà Jehova abịa n’ụlọ m. Anabughị m ege Ndịàmà Jehova ntị. Mgbe ọ bịara, ajụrụ m ya ọtụtụ ajụjụ iji gosi ya na ọ na-ezi ozizi ụgha. Ma, o ji Baịbụl zaa m ha niile. Nke a mere ka m ghọta na ọ naghị ezi ozizi ụgha.”

Ihe a kụziiri Patricia mere ka ọ ghọta na ọ bụghị ebe mmadụ bi ma ọ bụ ego ga-eme ka onye ahụ nwee obi ụtọ ma ọ bụkwanụ mee ka ihe dịrị ya mma. Kama, ọ bụ ịmara Chineke na ihe ndị o bu n’obi imere anyị. (Jọn 17:3) Patricia mụtara ọtụtụ ihe. Ọ mụtara na Chineke nwere aha nakwa na aha ya bụ Jehova. (Abụ Ọma 83:18) Ọ gụtakwara na Baịbụl na ndị mmadụ agaghị ada ogbenye n’Alaeze Chineke nakwa na ọ bụ Jizọs ga-achị n’Alaeze ahụ. (Daniel 7:13, 14) Abụ Ọma 72:12, 14 kwuru, sị: “[Jizọs] ga-anapụta ogbenye nke na-eti mkpu enyemaka, nakwa onye nọ n’ahụhụ na onye ọ bụla na-enweghị onye na-enyere ya aka. Ọ ga-anapụta mkpụrụ obi ha ná mmegbu nakwa n’ihe ike.”

Ọ ga-adị mma ka i wepụta oge na-amụ Okwu Chineke bụ́ Baịbụl. Ị na-amụ ya, ị ga-ama ihe kacha mkpa ná ndụ gị na otú ị ga-esi mee ihe ya aghara ịghọ gị ahịa. Ihe ọzọ bụ na ọ ga-enyere gị aka ma ihe siwere gị ike. Kama ịna-enwe obi ọjọọ, ị ga na-enwe obi ụtọ n’ihi na ị ma na ihe ga-emecha dị mma.—Ilu 2:6-9, 20, 21.