Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! MACH 2013

 Ihe Baịbụl Kwuru

Ahụhụ Ndị Ụwa Na-atụ n’Ọnụ Na-ata Ọ̀ Na-emetụ Chineke n’Obi?

Ahụhụ Ndị Ụwa Na-atụ n’Ọnụ Na-ata Ọ̀ Na-emetụ Chineke n’Obi?

Ndị Ụwa Na-atụ N’ọnụ

Ahụhụ Ndị Ụwa Na-atụ n’Ọnụ Na-ata Ọ̀ Na-emetụ Chineke n’Obi? “Ka ụzọ ndụ unu bụrụ nke ịhụnanya ego na-adịghị na ya . . . N’ihi na [Chineke ekwuwo], sị: ‘M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị.’”Ndị Hibru 13:5.

OTÚ CHINEKE SI EGOSI NA AHỤHỤ HA NA-ATA NA-EMETỤ YA N’OBI

Jehova na-enyere ndị na-ejere ya ozi aka mgbe ọ bụla ihe na-esiri ha ike. Dị ka ihe atụ, ọ na-eji ụmụnna anyị enyere anyị aka. * Jems 1:27 kwuru, sị: “Ụdị ofufe nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ụzọ Chineke bụ́ Nna anyị si ele ihe anya bụ: ilekọta ụmụ mgbei na ụmụ nwaanyị di ha nwụrụ ná mkpagbu ha.”

N’oge ochie, Ndị Kraịst nyeere ibe ha ihe na-esiri ike aka. Dị ka ihe atụ, mgbe e buru amụma na ụnwụ ga-ada n’obodo Judia, Ndị Kraịst nọ na Siria dị n’Antiọk ‘zigaara ụmụnna bi na Judia ihe enyemaka.’ (Ọrụ Ndịozi 11:28-30) Ihe ndị ahụ ha zigaara ha nyeere ha ezigbo aka mgbe ahụ ụwa na-atụ ha n’ọnụ. Ha gbataara ha ọsọ enyemaka n’ihi na ha hụrụ ha n’anya.—1 Jọn 3:18.

 Olee otú ndị ụwa na-atụ n’ọnụ ga-esi baara onwe ya uru?

“Mụ onwe m, Jehova, bụ Chineke gị, Onye na-akụziri gị otú ị ga-esi baara onwe gị uru.”—Aịzaya 48:17, 18.

CHINEKE NA-AGWA ANYỊ IHE NDỊ GA-EME KA ANYỊ BAARA ONWE ANYỊ URU

Ọtụtụ nde mmadụ achọpụtala na ihe Baịbụl kwuru bara ezigbo uru. Ilu 2:6, 7 kwuru, sị: “Ọ bụ Jehova na-enye amamihe; ihe ọmụma na nghọta na-esi n’ọnụ ya apụta. Ọ bụkwa ndị ziri ezi ka ọ ga-echekwara ezi amamihe.” Ndị mmadụ na-abara onwe ha uru ma ha mee ihe Chineke kwuru.

Dị ka ihe atụ, ha agaghị eji ego ha na-eme ihe na-agaghị abara ha uru ma ọ bụkwanụ ihe ndị ga-akpatara ha ọrịa, ihe ndị dị ka ịṅụ ọgwụ ọjọọ na ịṅụ oké mmanya. (2 Ndị Kọrịnt 7:1) Ha ga na-akwụwa aka ọtọ ma na-arụsi ọrụ ike. Nke a ga-eme ka a na-ewe ha n’ọrụ. Ha nwetakwa ọrụ, ndị ha na-arụrụ ọrụ agaghị eji ha egwu egwu. Ndị Efesọs 4:28 kwuru, sị: “Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi, kama ka ọ rụsie ọrụ ike, . . . ka o wee nwee ihe ọ ga-ekenye onye nọ ná mkpa.”

È nwere ihe gosiri na ihe Baịbụl kwuru na-abara ndị ụwa na-atụ n’ọnụ uru?

“A na-egosi na amamihe [Chineke] ziri ezi site n’ọrụ ya.”—Matiu 11:19.

IHE NDỊ GOSIRI NA IHE BAỊBỤL KWURU BARA URU

O nwere otu Onyeàmà Jehova aha ya bụ Wilson. O bi na Gana. E were ya n’ọrụ ọ na-agaghị arụte aka. N’ụbọchị ikpeazụ ọ ga-arụ ọrụ ebe ahụ, manịja ụlọ ọrụ ha gwara ya ka ọ saara ya ụgbọala. Mgbe ọ na-asa ụgbọala ahụ, o meghere buutu ya, hụ nnukwu ego. Ọga ya gwara ya ka o were ego ahụ, ma ọ jụrụ n’ihi na ọ ma na ọ bụ ohi. Kama iwere ya, ọ gara nye ya onye nwe ya. Ihe a Wilson mere mere ka a hapụ ya ka ọ nọgide na-arụ ọrụ n’ụlọ ọrụ ahụ. E mechakwara bulie ya n’ọkwá.

E nwekwara Onyeàmà Jehova aha ya bụ Géraldine. O bi na Yurop. Onye ọ na-arụrụ ọrụ chụrụ ya n’ọrụ n’ihi na o jighị anya ahụ Ndịàmà Jehova. Ma, mama nwaanyị ahụ gwara ya na o meteghị ya. Ọ gwara ya na o kwesịrị ịhapụ Ndịàmà Jehova ka ha na-arụrụ ya ọrụ n’ihi na ha na-ekwu eziokwu, na-arụsikwa ọrụ ike. Onye ahụ Géraldine na-arụrụ ọrụ gara mee nchọnchọ ụfọdụ gbasara Ndịàmà Jehova. Mgbe o mechara, ọ gwara Géraldine ka ọ maliteghachi ọrụ.

O nwekwara otu nwaanyị Saụt Afrịka aha ya bụ Sarah. Nwaanyị a enweghị di. Mgbe ihe na-esiri ya ike, ụmụnna nọ n’ọgbakọ ya nyeere ya na ụmụ ya aka. Ha na-enye ha nri, na-akwụkwara ha ụgwọ ụgbọ. Ụmụ ya mechara kwuo na ọtụtụ ndị nọ n’ọgbakọ ha weere ha ka ụmụ ha.

Ọ bụghị naanị ndị a anyị kọrọ akụkọ ha ka ụdị ihe a merela, e nwekwara ọtụtụ ndị ọzọ. Nke a na-eme ka anyị cheta ihe Jehova kwuru n’Ilu 1:33. Ọ sịrị: “Onye na-ege m ntị ga-ebi n’obi iru ala.” Ihe a o kwuru bụ eziokwu.

^ para. 5 N’obodo ụfọdụ, gọọmenti na-enyere ndị ụwa na-atụ n’ọnụ aka. Ma, ya bụrụ n’obodo gọọmenti na-anaghị eme otú ahụ, ọ bụ ndị ikwu onye ahụ ga na-egboro ya mkpa ya.—1 Timoti 5:3, 4, 16.