Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

TETA! JENỤWARỊ 2013

 ISIOKWU TETA! A

Otú Ị Ga-esi Kụziere Ụmụ Gị Ka Ha Na-emere Ndị Ọzọ Ihe Ọma

Otú Ị Ga-esi Kụziere Ụmụ Gị Ka Ha Na-emere Ndị Ọzọ Ihe Ọma

E NWERE ọtụtụ ụzọ ndị mmadụ nwere ike isi na-emere ndị ọzọ ihe ọma kwa ụbọchị. Ma, ihe a na-ahụkarị bụ na ọtụtụ ndị na-eme ihe ga-adị naanị hanwa mma, ha anaghịdị achọ ịma otú ọ ga-adị ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ha na-egwu ndị ọzọ wayo. Ha anaghị echeta na e nwere ndị ọzọ nọ n’ụzọ ma ha na-akwọ ụgbọala. Ha na-ewe iwe ọkụ, na-agwakwa ndị ọzọ okwu ọjọọ.

Ị gaa n’ọtụtụ ezinụlọ, ị ga-ahụkwa ndị na-eme ihe ga-adị naanị onwe ha mma. Dị ka ihe atụ, e nwere ndị na-agba nwunye ha alụkwaghịm n’ihi na ha chere na nwunye ha ekwesịghịzi ha. E nwekwara ụfọdụ ndị nwunye na-eme otú ahụ. Ụfọdụ ndị nne na nna na-akụzikwara ụmụ ha ka ha na-eme ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Olee otú ha si eme ya? Ha na-emere ụmụ ha ihe ọ bụla ha chọrọ. Ha anaghịdị abara ha mba ma ọ bụ pịa ha ihe ma ha mee ihe na-adịghị mma.

Ma, ọ bụghị otú ahụ ka ọtụtụ ndị nne na nna si eme. Ha na-akụziri ụmụ ha ka ha na-eme ihe ndị ga-abara ndị ọzọ uru. Nke a na-abakwara ụmụ ha ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, ọ na-eme ka ọ dịrị ha mfe imete enyi. Ha na ndị enyi ha anaghịkwa esekarị okwu. Obi na-adịkarị ha ụtọ n’ihi na Baịbụl kwuru na “a na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”—Ọrụ Ndịozi 20:35.

Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, olee otú ị ga-esi zụọ ụmụ gị ka ha na-emere ndị ọzọ ihe ọma? Ka anyị tụlee ihe atọ nwere ike ime ka ụmụ gị na-eme ihe ga-abara naanị onwe ha uru. Anyị ga-atụlekwa ihe ị ga-eme ka ị ghara isi otú ahụ na-azụ ụmụ gị.

 1 Ito nwa gị mgbe niile

Ihe mere na ọ dịghị mma. Ndị na-eme nchọpụta kwuru na ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị na-arụ ọrụ chere na ihe ga-agaziri ha ma hà gbara mbọ ma ha agbaghị. Ụfọdụ n’ime ha na-eche na e kwesịrị ibuli ha n’ọkwà ozugbo ha malitere ọrụ ọ bụrụgodị na ọrụ ahụ edobeghị ha anya. E nwere ndị nke na-eche na ha bụ ọkaibe, na-achọ ka ndị ọzọ na-akpọrọ ha isiala. Obi na-ajọkwa ha njọ ma ọ bụrụ na ihe agaghị otú ha si tụọ anya ya.

Ihe mere ndị nne na nna na-eji eto nwa ha mgbe niile. Ihe mere ndị mmadụ na-eji ebuli onwe ha elu mgbe ụfọdụ bụ otú e si zụọ ha. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị nne na nna na-eto ụmụ ha ma mgbe ha mere ihe ọma ma mgbe ha mere ihe ọjọọ. Ihe mere ha ji eme ya bụ na ọtụtụ ndị na-eme ya taa. Ha na-ekwu na ọ bụrụ na ikele nwatakịrị ma o mee ihe abụghị ihe ọjọọ, ito ya ma mgbe o mere ihe dị mma ma mgbe o mehiere ihe abụghịkwa ihe ọjọọ. Ha na-ekwukwa na obi agaghị adị nwatakịrị mma ma ọ bụrụ na a gwa ya na ihe o mere adịghị mma. Taa, ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna anaghị eto nwa ya mgbe niile, ndị mmadụ ga-ewere ya na ọ maghị otú e si azụ nwa. A na-agwakwa ndị nne na nna na ha ekwesịghị ime ka obi jọọ ụmụ ha njọ.

Ọ bụ ihe a ndị mmadụ na-ekwu mere ọtụtụ ndị nne na nna na-eji eto ụmụ ha mgbe niile, ya sọkwa ya ya bụrụ na ụmụ ha mere ihe ọjọọ. Ụmụ ha mehaala ihe, ha etoo ha, ọ bụrụgodị na ihe ahụ enweghị ihe ọ bụ. Ha mee ihe ọjọọ, ha eleghara ya anya, ọ bụrụgodị na ihe ahụ jọgburu onwe ya. Ha chere na ọ bụrụ na ha ana-eleghara ihe ọjọọ ụmụ ha mere anya ma na-aja ha mma mgbe niile, ọ ga-eme ka obi na-adị ụmụ ha mma. Ihe ka ha mkpa bụ ime ka isi na-ebu ụmụ ha, ọ bụghị ịkụziri ha otú ha ga-esi na-eme ihe ndị ga-eme ka obi na-adị ha mma.

Ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl kwuru na ọ dịghị njọ ma e too nwatakịrị mgbe o mere ihe dị mma. (Matiu 25:19-21) Ma, ọ bụrụ na ihe mere e ji eto ụmụaka bụ ka obi dị ha mma, o nwere ike ime ka ha chewe na o nweghị onye hà ka ha. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla echee na ọ dị ihe ya bụ mgbe ọ na-adịghị ihe ọ bụ, ọ na-aghọgbu obi ya.” (Ndị Galeshia 6:3) N’ihi ya, Baịbụl gwara ndị nne na nna sị: “Ahapụla ịdọ nwatakịrị aka ná ntị. Ọ bụrụ na ị pịa ya ụtarị, ọ gaghị anwụ.” *Ilu 23:13.

Ihe ị ga-eme. Ụmụ gị mee ihe na-adịghị mma, mee ka ha ghọta na ihe ahụ ha mere adịghị mma. Ha mee ihe dị mma, jaa ha mma. Ekwola na ị chọrọ ka obi dị ha mma na-eto ha. Ọ bụghị ya ga-eme ka obi dị ha mma. Otu akwụkwọ kwuru na ọ bụghị inye mmadụ otuto elu ọnụ na-eme ka obi na-adị ya mma, kama ọ bụ onye ahụ ịgbalị na-emezi ihe ndị ọ na-anaghị emeta. O kwesịkwara ịgba mbọ na-amụta ihe ọhụrụ.

“M na-arịọ onye ọbụla n’ime unu, ka ọ ghara iche na ya dị elu karịa otu o kwesịrị ka o chee.”—Ndị Rom12:3, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik

 2 Ịpa ụmụaka ka àkwá

Ihe mere na ọ dịghị mma. Ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ndị malitere ọrụ ọhụrụ anaghị edi nsogbu ndị na-abịara ha n’ebe ha na-arụ ọrụ. Ọ na-abụ ụfọdụ n’ime ha mejọọ ihe, a gwa ha ya, iwe abịa ha. Ndị ọzọ bụ emete emete, ha na-ahọkwa ọrụ. Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwoke na-agba ndị bịara ka e wee ha n’ọrụ ajụjụ ọnụ. O kwuru ihe otu nwa okorobịa gwara ya mgbe ọ na-agba ya ajụjụ ọnụ. Nwa okorobịa ahụ sịrị: “Ama m na e nwere ọrụ ụfọdụ na-esi ike ọrụrụ, ma achọghị m ịrụ ọrụ siri ike.” Nwoke ahụ kwuru, sị: “Ọ maghị na e nweghị ọrụ dị mfe. O juru m anya na onye dị afọ iri abụọ na atọ amaghị nke a.”

Ihe mere ndị nne na nna ji apa ụmụ ha ka àkwá. Ọtụtụ ndị nne na nna taa anaghị ekwe ka ụmụ ha taa ahụhụ ihe ha metere. Gịnị ka ị na-eme ma nwa gị daa n’ule? Ihe ị na-eme ọ̀ bụ ịgakwuru onye nkụzi ya ka o bufee ya na klas ọzọ? Gịnị ka ị na-eme ma nwa gị mara ụma mebie ihe n’ụlọ? Ị̀ na-aga zụchie ihe ahụ? Ọ bụrụkwanụ na nwa gị na enyi ya esee okwu, ị̀ na-agwa ya na ọ bụ enyi ya chọrọ okwu?

O nweghị nne ma ọ bụ nna chọrọ ka ụmụ ya taa ahụhụ. Ma, ọ bụrụ na ị na-apa ha ka àkwá, ha ga-abịa chewe na ọ bụghị hanwa kwesịrị ịta ahụhụ ihe ha metere. Otu akwụkwọ kwuru na ụmụaka e si otú ahụ zụọ anaghị edi nsogbu ọ bụla bịaara ha, ha anaghịkwa amụta ihe na ya. Kama ime otú ahụ, ha ga-abịa chewe na o nweghị onye hà ka ha. Ha gaa kote ụka, ha atụwa anya ka papa ha na ndị ọzọ bịa zọọ ha.

Ihe Baịbụl kwuru. O nweghị onye n’ime anyị na-anaghị enwe nsogbu. Baịbụl kwuru na “ihe ndanye ọjọọ na-adanyere onye ọ bụla.” (Ekliziastis 9:11, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society) Ihe ọjọọ na-eme ma ndị ezigbo mmadụ ma ndị ajọ mmadụ. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi tara ahụhụ oge ọ na-eje ozi ọma. Ma, ahụhụ ndị ahụ ọ tara baara ya uru. O dere, sị: ‘Amụtawo m inwe afọ ojuju n’ọnọdụ ọ bụla m nọ na ya. Amụtawo m ma otú e si eriju afọ ma otú e si anọ agụụ, ma otú e si enwe ihe n’ụba ma otú e si anọ n’ụkọ.’—Ndị Filipaị 4:11, 12.

Ihe ị ga-eme. Ọ bụrụ na nwa gị etoruola ogo mmadụ, hapụ ya ka o mee ihe Baịbụl kwuru ná Ndị Galeshia 6:5. Ebe ahụ sịrị: “Onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.” N’ihi ya, ọ bụrụ na nwa gị amara ụma mebie ihe, ọ ga-akacha mma ka ị hapụ ya ka o were ego ya zụchie ihe ahụ. Ọ bụrụkwa na nwa gị adaa n’ule, hapụ ya ka ọ gụgharịa klas ahụ. Nke a ga-eme ka ọ mụta na o kwesịrị ịgụsikwu akwụkwọ ike. Ọ bụrụkwa na nwa gị na enyi ya esee okwu, kasie ya obi. Ma e mechaa, nyere ya aka ka o chebara onwe ya echiche. I nwere ike ịjụ ya ihe ọ mụtara n’ihe ahụ merenụ. Ọ bụrụ na ụmụaka ejiri aka ha na-edozi nsogbu ha, ụjọ agaghị atụ ha ma nsogbu bịara ha. Ma, ọ bụrụ na ị na-apa ha ka àkwá, ụjọ ga na-atụ ha ma nsogbu bịara ha.

“Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya, mgbe ahụkwa ọ ga-enwe aṅụrị n’ọrụ ya.”—Ndị Galeshia 6:4

3 Imere ha ihe ọ bụla ha kwuru

Ihe mere na ọ dịghị mma. O nwere oge a jụrụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa ihe ha chere banyere mmadụ inwe ego na mmadụ inyere ndị ọzọ aka. Ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ ha niile kwuru na inwe ego dị  mkpa karịa inyere ndị mmadụ aka. Ma, ego anaghị eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Otu nchọpụta e mere gosiri na ndị na-achụ ego anaghị enwe obi ụtọ. Obi na-ajọkarị ha njọ, ha na-arịakarịkwa ọrịa ma na-echegbu onwe ha.

Ihe mere ndị nne na nna ji emere ụmụ ha ihe ọ bụla ha kwuru. Ihe na-akpata ya mgbe ụfọdụ bụ na ndị nne na nna na-achụ ego ọnwụ ọnwụ. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ndị nne na nna chọrọ ka obi na-adị ụmụ ha mma. Ụmụaka chọkwara ka a na-azụrụ ha ihe ọ bụla ha tụrụ aka. Ọ bụ ya mere ndị nne na nna ji azụrụ ụmụ ha ihe ọ bụla ha chọrọ. Nke a na-eme ka obi dị ụmụ ha mma, ma obi ụtọ ha anaghị adịte aka. Tupu ị mara ihe na-emenụ, ha achọọ ka a zụtara ha ihe ọzọ.”

Nke bụ́ eziokwu bụ na otú ụlọ ọrụ ndị na-emepụta ngwá ahịa si akpọsa ngwá ahịa ha na-eme ka ndị mmadụ chee na ha ga-azụrịrị ihe ahụ. Ha na-eme ka ndị mmadụ chee na ha kwesịrị ịzụ ihe ọ bụla e mepụtara ma hà ji ego ya ma ha ejighị. Ọtụtụ ụmụ okorobịa na ụmụ agbọghọbịa na-aga azụ ihe ndị a. Nke a emeekwala ka ha baa n’ụgwọ n’ihi na ha anaghị akwụli ụgwọ ha.

Ihe Baịbụl kwuru. Baịbụl kwuru na ego bara uru. (Ekliziastis 7:12) Ma, o kwuru na “ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile.” O kwukwara, sị: ‘Site n’ịchụso ụdị ịhụnanya a, ụfọdụ ejirila ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.’ (1 Timoti 6:10) Baịbụl gwara anyị na anyị ekwesịghị ịna-achụ ego ọnwụ ọnwụ nakwa na obere ihe anyị nwere kwesịrị iju anyị afọ.—1 Timoti 6:7, 8.

“Ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya na-adaba n’ọnwụnwa na ọnyà na ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha, ndị na-emerụkwa ahụ́.”—1 Timoti 6:9

Ihe ị ga-eme. Ndị nne na nna kwesịrị ichebara onwe ha echiche mara ma hà na-achụ ego ọnwụ ọnwụ. Gbalịa hụ na ị naghị azụ ihe ọ bụla ị hụrụ, kụziekwara ụmụ gị ka ha ghara ịna-eme otú ahụ. Otu akwụkwọ kwuru na ndị nne na nna na ụmụ ha kwesịrị ịnọrọ ala tụlee mgbe ha kwesịrị ịzụ ihe na mgbe ha na-ekwesịghị ịzụ ya. Ha kwesịkwara ịkụziri ha otú e si ekwe ihe ọnụ. Ọ dịkwa mma ka ha chọpụta ma ò nwetụla mgbe ụmụ ha sooro ọnụ ndị mmadụ zụọ ihe ha na-achọghị ịzụ.

Gị na ụmụ gị see okwu, kwurịtanụ ya. Echela na otú ị ga-esi edozi ya bụ ịzụtara ha ihe ọ bụla ha chọrọ. Otu akwụkwọ kwuru, sị: “Ihe i kwesịrị ime ma gị na ụmụ gị see okwu abụghị ịga zụtara ha ihe ma ọ bụ nye ha ego n’ihi na ọ gaghị eme ka obi dị ha mma. I kwesịrị imeda obi ka gị na ha kwurịta ya. Meekwa ka ha ghọta na ị hụrụ ha n’anya.”

^ para. 11 Ihe Baịbụl na-ekwu abụghị ka a na-emegbu ụmụaka ma ọ bụ na-agwa ha okwu ọjọọ. (Ndị Efesọs 4:29, 31; 6:4) Ihe mere ndị nne na nna ga-eji dọọ ụmụ ha aka ná ntị bụ ka ha kụziere ha ihe, ọ bụghị ka ha mesie ha ike.