Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

ỤLỌ NCHE Nke 5 n'Afọ 2016

Ndagwurugwu Ila

Akụkọ Devid na Golayat, Ò Mere Eme n’Eziokwu?

Akụkọ Devid na Golayat, Ò Mere Eme n’Eziokwu?

Ụfọdụ ndị amaghị ma akụkọ Devid na Golayat ọ̀ mere eme ka ọ̀ bụ akụkọ ifo. Mgbe ị na-agụ isiokwu bu nke a ụzọ, ị̀ nọ na-eche ma akụkọ ahụ o mere eme n’eziokwu? Ya bụrụ otú ahụ, biko, chebara azịza ajụjụ atọ ndị anyị na-aga ileba anya ugbu a echiche.

1 | Mmadụ ò nwere ike ịdị ihe dị ka mita atọ n’ogologo?

Baịbụl kwuru na Golayat dị “kubit isii na otu ntụ ọbụ aka n’ogo.” (1 Samuel 17:4) Otu kubit bụ sentimita iri anọ na anọ na ọkara; otu ntụ ọbụ aka bụ ihe dị ka sentimita iri abụọ na abụọ. Nke a pụtara na Kubit isii ma ọ bụ narị sentimita abụọ na iri isii na asaa na otu ntụ ọbụ aka ma ọ bụ sentimita iri abụọ na abụọ bụ ihe dị ka mita atọ. Ụfọdụ ndị na-ekwu na o nweghị otú Golayat ga-esi haruo otú ahụ. Chebagodịrị ihe a echiche: N’oge anyị a, nwoke a na-ahụbeghị onye ka ya ogologo dị ihe karịrị mita abụọ na ọkara n’ogologo. Ọ̀ bụ na ọ gaghị ekwe omume na Golayat ji ihe dị ka sentimita iri na ise ka ya ogologo? Golayat bụ otu n’ime ụmụ ndị Refeyim. Ndị Refeyim na-agba ajọ dimkpa. N’agbata afọ 1201 na afọ 1300 Tupu Oge Ndị Kraịst, otu akwụkwọ e dere n’Ijipt kwuru na ụfọdụ ndị ọchịagha a na-atụ egwu n’obodo Kenan dị ihe dị ka mita abụọ na ọkara n’ogologo. Ihe a niile gosiri na n’agbanyeghị na o nweghị onye ọzọ a hụrụla toro ogologo ka Golayat, ọ pụtaghị na Golayat e torughị ogologo otú ahụ Baịbụl kwuru.

2 | Ò nwedịrị onye bụ́ Devid a kọrọ akụkọ ya na Baịbụl?

E nwere oge ndị ọkà mmụta nọ na-achọ ebe ha ga-agbakwasị ụkwụ sị na akụkọ Eze Devid bụ akụkọ ifo, ma ha achọtalighị ya. Otu ihe gosiri na akụkọ Devid mere eme bụ na ndị na-amụ banyere ihe ndị mgbe ochie hụrụ ebe e dere “ụlọ Devid” n’otu ihe e dere n’oge ochie. Ihe Jizọs Kraịst kwuru gbasara Devid gosikwara na e nwere onye bụ́ Devid. (Matiu 12:3; 22:43-45) Ihe ọzọ bụ na e nwere ebe abụọ na Baịbụl a nọ na-akpọ ezinụlọ ndị Jizọs si iji gosi na ọ bụ ya bụ Mesaya, a kpọọ aha Eze Devid. (Matiu 1:6-16; Luk 3:23-31) O doro anya na e nwere onye bụ́ Devid.

3 | Ebe ndị e kwuru na a nọ lụọ agha ahụ hà dị adị?

Baịbụl kwuru na a lụrụ agha ahụ na Ndagwurugwu Ila. Ma ọ kapịkwuru ebe ọ bụ ọnụ. O kwuru na ndị Filistia mara ụlọikwuu ha n’ugwu dị́ n’agbata obodo Soko na obodo Azika. Ndị Izrel guzo n’ugwu chere ihu n’ugwu nke ndị Filistia nọ, ndagwurugwu Ila dịkwa n’etiti ha. Ebe ndị a hà dị adị?

Otu nwoke gara ebe ahụ na nso nso a kwuru, sị: “Onye kpọgharịrị anyị abụghị onye chọọchị. Ọ kpọ anyị gaa na Ndagwurugwu Ila. Anyị garuru n’ọnụ ọnụ otu ugwu dị́ ebe ahụ. Ka anyị nọ na-ele ndagwurugwu ahụ, ọ sịrị anyị gụọ 1 Samuel 17:1-3. Ọ tụziiri anyị aka n’ófè ndagwurugwu ahụ ma sị: ‘N’aka ekpe ebe ahụ ka obodo Soko dakpọrọ adakpọ dị.’ Ọ tụgharịkwara sị anyị, ‘N’aka nri ka obodo Azika dakpọrọ adakpọ dị. Ndị Filistia mara ụlọikwuu n’agbata obodo abụọ ahụ, n’ugwu nke chere unu ihu. N’ihi ya, ọ ga-abụ na ebe a anyị guzo bụ ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu.’ M nọ na-agwa onwe m na ọ ga-abụ na ebe ahụ m guzo bụ ebe Sọl na Devid guzo mgbe ahụ. Mgbe anyị si n’ugwu ahụ rịdata, na-aga na ndagwurugwu ahụ, anyị gafere ebe mmiri na-esi asọfe, ma ọ bụzi ala akọrọ, bụrụkwa nkume nkume. Ozugbo ahụ, m ji uche m na-ahụ ka Devid hulatara tụtụrụ nkume ise na-akwọ mụrụmụrụ, nke o ji otu n’ime ha gbuo Golayat.” Obi tọrọ nwoke a ụtọ na ihe niile Baịbụl kọrọ gbasara Devid na Golayat bụ eziokwu. Otú ahụkwa ka ọ dị ọtụtụ ndị taa.

O nweghị ebe mmadụ ga-agbakwasị ụkwụ sị na akụkọ a emeghị eme. Ndị a kọrọ akụkọ ha nwere oge ha dịrị ndụ, ebe ndị a kọrọ ihe niile nọ mee dịkwa adị. Nke ka nke bụ na akụkọ a so n’Okwu Chineke e ji ike mmụọ nsọ dee. O si n’aka Chineke nke eziokwu, Onye “na-apụghị ịgha ụgha.”—Taịtọs 1:2; 2 Timoti 3:16.