Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ ỌKTOBA 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ILU 7-11

“Ka Obi Gị Ghara Ịtụgharị”

“Ka Obi Gị Ghara Ịtụgharị”

Iwu Jehova nwere ike ichebe anyị. Ma, ihe ga-eme ka o chebe anyị bụ ma anyị mee ka ọ dịrị anyị n’obi. (Ilu 7:3) Ọ bụrụ na onye na-efe Jehova ekwe ka iwu Jehova pụọ ya n’obi, ọ ga-eme ka ọ dịrị Ekwensu mfe iji aghụghọ ya dị iche iche ghọgbuo onye ahụ. Ilu isi 7 kwuru maka otu nwa okorobịa kwere ka a rafuo ya. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ndị o mejọrọ?

  • Setan na-eji ihe ndị na-amasị akụkụ ahụ́ anyị dị iche iche achọ ime ka anyị hapụ Jehova

  • Ma amamihe na nghọta ga-enyere anyị aka ịmata nsogbu ime ihe ọjọọ ga-akpatara anyị. Ọ ga-emezi ka anyị gbaara ihe ọjọọ ahụ ọsọ