Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ ỌKTOBA 2016

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

TETA!

Ajụjụ: Ụfọdụ ndị na-eche na Jizọs abụghị mmadụ dịrị ndụ n’ụwa a. Ma, o nwere ndị kwetara na Jizọs dịrị ndụ n’ụwa a, nweekwa ndị nke sị na ha amaghị. Olee ihe gịnwa chere?

Otú a ga-esi enye ya: Teta! a kwuru ihe ndị ga-enyere gị aka ịma nke bụ́ eziokwu.

NA-AKỤZI EZIOKWU

Ajụjụ: Gịnị na-eme mmadụ ma ọ nwụọ?

Amaokwu Baịbụl: Jọn 11:11-14

Eziokwu: Mmadụ nwụọ, onye ahụ anwụchaala. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịtụ ụjọ ihe ga-eme anyị ma anyị nwụọ. Jizọs ji ọnwụ tụnyere ụra. O nwere ike ịkpọte ndị nwụnahụrụ anyị ka ha dịrịkwa ndụ n’ụwa otú ahụ ọ kpọtere Lazarọs.Job 14:14.

AKWỤKWỌ ỊKPỌ ÒKÙ ỌMỤMỤ IHE (inv)

Otú a ga-esi enye ya: O nwere okwu a ga-ekwu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe anyị na-anọ efe Chineke. M na-akpọ gị ka ị bịa gere okwu ahụ n’akwụghị ụgwọ ọ bụla. [Nyezie ya akwụkwọ ịkpọ òkù ahụ. Gosi ya ebe e dere oge na ebe anyị na-enwe ọmụmụ ihe ngwụcha izu, gwakwa ya isiokwu okwu ihu ọha a ga-ekwu.]

Ajụjụ: Ị̀ bịatụla ọmụmụ ihe anyị mbụ? [I nwere ike igosi ya vidio bụ́ Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?]

DEE OTÚ Ị GA-ESI EME NKE GỊ

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.