Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ NỌVEMBA 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | EKLIZIASTIS 1-6

Ka Ọrụ Ị Na-arụsi Ike Na-eme Gị Obi Ụtọ

Ka Ọrụ Ị Na-arụsi Ike Na-eme Gị Obi Ụtọ

Jehova chọrọ ka ọrụ anyị na-atọ anyị ụtọ. Ọ na-akụzikwara anyị otú anyị ga-esi na-eme ka ọ na-atọ anyị ụtọ. Ọrụ anyị ga na-atọ anyị ụtọ ma anyị na-ele ya anya otú kwesịrị ekwesị.

Lee ihe ndị ị ga-eme ma ọ bụrụ na ị chọrọ ka ọrụ gị na-atọ gị ụtọ:

3:13; 4:6

  • Na-etinyere ya obiọma

  • Na-eche banyere uru ọrụ gị na-abara ndị ọzọ

  • Ị gaa ọrụ, mee ike gị niile. Mana, ị lọta, tinyezie uche gị n’ihe gbasara ezinụlọ gị na ofufe ị na-efe Chineke