Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ MEE 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 1-10

Ịkwanyere Jizọs Ùgwù Ga-eme Ka Anyị na Jehova Dị́ ná Mma

Ịkwanyere Jizọs Ùgwù Ga-eme Ka Anyị na Jehova Dị́ ná Mma

E buru amụma na o nwere ndị ga-akpọ Jehova na Jizọs asị

2:1-3

  • E buru amụma na mba dị iche iche agaghị achọ ka Jizọs na-achị ha, kama, ha ga-achọ ka ọ bụrụ hanwa na-achị

  • Amụma ahụ mezuru n’oge Jizọs nọ n’ụwa, ọ kachakwa emezu n’oge anyị a

  • Onye dere Abụ Ọma ahụ kwuru na mba dị iche iche na-atamu ihe efu, ya bụ na mbọ niile ha na-agba ga-akụ afọ n’ala

Ọ bụ naanị ndị na-akwanyere Eze ahụ Jehova tere mmanụ ùgwù ga-adị ndụ

2:8-12

  • A ga-ebibi ndị niile na-emegide Jizọs

  • Ọkọ agaghị akọ ndị niile kwanyeere Jizọs ùgwù, obi ga-erukwa ha ala