Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ MEE 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú E Si Eji JW Library Eme Ihe

Otú E Si Eji JW Library Eme Ihe

ỊMỤ IHE N’ONWE GỊ:

  • I nwere ike iji ya na-agụ Baịbụl na ihe mmụta dịịrị ụbọchị

  • Ọ ga-enyere gị aka ịna-agụ Akwụkwọ Mgbaafọ, magazin na akwụkwọ ndị ọzọ

  • Ọ ga-enyere gị aka ịna-akwadebe ọmụmụ ihe. Ọ ga-enyekwara gị aka ịkanye azịza gị ihe

  • I nwere ike iji ya lee vidio

N’ỌMỤMỤ IHE:

  • I nwere ike iji ya na-emepe amaokwu Baịbụl a na-agụ

  • JW Library ga-eme ka ị ghara ibu ọtụtụ akwụkwọ na-aga ọmụmụ ihe. I nwere ike isi na ya nweta ma akwụkwọ niile a ga-eji amụ ihe ma abụ. Abụ ọhụrụ niile a na-ebipụtabeghị dịcha na ya

N’OZI ỌMA:

  • I nwere ike igosi onye nwere mmasị i ziri ozi ọma ihe ndị dị́ na JW Library, gị enyekwara ya aka danloduo JW Library nke ya nakwa ihe ndị anyị nwere dị́ na ya

  • I nwere ike idenye ihe ụfọdụ amaokwu ị na-achọ kwuru ka o bupụtara gị amaokwu ahụ

  • Ọ bụrụ na onye ị gara izi ozi ọma nwere ụmụaka, i nwere ike igosi ha otu n’ime vidio Kelechi. I nwekwara ike igosi mmadụ vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị? Ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’ozi ọma anaghị anụ Igbo, i nwere ike isi na JW Library kpọnyere ya vidio dị́ n’asụsụ ya

  • I nwere ike iji ya gosi mmadụ amaokwu Baịbụl n’asụsụ ya ma ọ bụrụ na ị danloduru asụsụ ahụ. I mepee amaokwu ahụ, gị apịa nọmba amaokwu ahụ aka, ya ebupụtara gị ihe ndị e sere ese, gị apịzie nke e sere ihe yiri Baịbụl