Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ MEE 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 11-18

Ònye Ga-abụ Ọbịa n’Ụlọikwuu Jehova?

Ònye Ga-abụ Ọbịa n’Ụlọikwuu Jehova?

Ọ bụ onye bụ enyi Chineke ga-abụ ọbịa n’ụlọikwuu ya. Onye ahụ ga-atụkwasị ya obi, na-erubekwara ya isi. Abụ Ọma nke iri na ise kwuru ụdị onye Jehova ga-ekwe ka ọ bụrụ enyi ya.

ENYI JEHOVA GA . . .

  • na-eme ezi omume

  • na-ekwu eziokwu n’obi ya

  • na-akwanyere ụmụnna ya ùgwù

  • na-eme ihe o kwere ná nkwa a sịgodị na o mechara chọpụta na ọ ga-ebu ya aka

  • na-enyere ndị nọ ná mkpa aka, n’atụghị anya irite ihe ọ bụla n’aka ha

ENYI JEHOVA AGAGHI . . .

  • na-agba asịrị ma ọ bụ na-ekwutọ ndị ọzọ

  • na-eme mmadụ ibe ya ihe ọjọọ

  • na-aghọ ụmụnna ya aghụghọ

  • na-eso ndị na-enupụrụ Jehova isi ma ọ bụ ndị na-anaghị efe ya akpakọrịta

  • na-eri ngarị