Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ MEE 2016

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

ỤLỌ NCHE

Ajụjụ: Ì chere na ihe e kwuru n’ebe a anyị ga-agụ na Baịbụl ugbu a ga-eme eme?

Amaokwu Baịbụl: Mkpu. 21:3, 4

Otú a ga-esi enye ya: Ụlọ Nche a kọwara otú Chineke ga-esi emezu nkwa ahụ o kwere nakwa otú nkwa ahụ ga-esi abara anyị uru.

ỤLỌ NCHE (peeji nke 16)

Ajụjụ: Legodị ajụjụ a dị́ ebe a. [Gụpụtara ya ajụjụ nke mbụ dị́ na peeji nke 16 na azịza ndị dị́ n’okpuru ya.] Gịnị ka i chere?

Amaokwu Baịbụl: Ọma 83:18

Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu a ga-akọwakwuru gị ihe ndị ọzọ Baịbụl kwuru gbasara aha Chineke.

BAỊBỤL NA-AKỤZIRI ANYỊ

Ajụjụ: Ụfọdụ ndị na-eche na ọ bụ Chineke na-achị ụwa a. Ma, ì chere na ọ bụ onye ọzọ dị iche ka Baịbụl kwuru na-achị ụwa?

Amaokwu Baịbụl: 1 Jọn 5:19

Otú a ga-esi enye ya: Akwụkwọ a ga-eme ka ihe a amaokwu Baịbụl a kwuru dokwuo gị anya, ọ ga-akọwakwara gị gbasara ihe ndị ọzọ Baịbụl na-akụzi.

DEE OTÚ ỌZỌ Ị GA-ESI JIRI OTU N’IME AKWỤKWỌ NDỊ A ZIE OZI ỌMA

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.