Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Ebe ụmụnna ndị nọ na Jamanị na-echeta ọnwụ Jizọs

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ MACH 2016

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Otú e nwere ike isi nye ndị mmadụ Ụlọ Nche na akwụkwọ ịkpọ òkù maka Ncheta Ọnwụ Jizọs nke afọ 2016. Jiri aro ndị a dee otú ọzọ ị ga-esi enye ha.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Esta Gbachiteere Jehova na Ndị Na-efe Ya

O ji obi ike mee ihe a gaara eji gbuo ya, o nyekwaara Mọdekaị aka mee iwu ga-eme ka a ghara ibibi ndị Juu. (Esta 6-10)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Kwadebe Otú Ị Ga-esi Nye Mmadụ Magazin

Jiri aro ndị a dee otú gịnwa chọrọ isi enye mmadụ Ụlọ Nche na Teta!

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Nabata Ndị Zara Anyị Òkù

Olee otú anyị ga-esi anabata ndị zara anyị òkù na ndị na-anaghịzi abịa ọmụmụ ihe? Oleekwa otú anyị ga-esi enyere ha aka?

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Job Guzosiri Ike Mgbe Ọnwụnwa Bịaara Ya

O gosiri na ihe ka ya mkpa ná ndụ bụ irubere Jehova isi. (Job 1-5)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Job Kwuru Ihe Gosiri na Obi Adịghị Ya Mma

Obi jọrọ Job njọ, ya echewe ihe na-ezighị ezi. Ma, o meghị ka ọ kwụsị ịhụ Jehova n’anya. (Job 6-10)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

Obi Siri Job Ike na A Ga-akpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ

Ọ ma na Chineke ga-eme ka ọ dị ndụ ọzọ ma ọ nwụọ otú ahụ úkwù osisi si etolite ọzọ ma e gbutuo ya. (Job 11-15)

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ọnwụ Jizọs Mere Ka Mbilite n’Ọnwụ Nwee Isi

Jehova ji ọnwụ Jizọs mee ka obi sie anyị ike na ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ. Anyị ga-anabata ha kama ịna-eru uju na ha nwụrụ.