Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ JUN 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 34-37

Tụkwasị Jehova Obi ma Na-eme Ihe Ọma

Tụkwasị Jehova Obi ma Na-eme Ihe Ọma

“Ewela iwe n’ihi ndị na-eme ihe ọjọọ”

37:1, 2

  • Ekwela ka otú ihe si na-agaziri ndị ajọ omume ugbu a mee ka ị daa mbà. Lekwasị anya n’otú Jehova si na-agọzi gị nakwa n’ozi ị na-ejere ya

“Tụkwasị Jehova obi, na-emekwa ihe ọma”

37:3

  • Ka obi sie gị ike na Jehova ga-enyere gị aka mgbe ọ bụla ihe na-echu gị ụra. Ọ ga-eme ka i guzosie ike

  • Na-agachi ozi ọma anya

‘Ka ihe Jehova na-atọ gị ụtọ nke ukwuu’

37:4

  • Wepụta oge ị ga-eji na-agụ Baịbụl ma na-atụgharị uche ka i nwee ike ịmatakwu Jehova

“Nyefee ụzọ gị n’aka Jehova”

37:5, 6

  • Ka obi sie gị ezigbo ike na Jehova ga-enyere gị aka imeri ụdị nsogbu ọ bụla nwere ike ịbịara gị

  • Gbaa mbọ mee ihe ziri ezi mgbe a na-akpagbu gị ma ọ bụkwanụ mgbe e boro gị ebubo

“Gbachie nkịtị n’ihu Jehova, cheresie ya ike”

37:7-9

  • Etinyela aka n’ihe ndị nwere ike ime ka ị ghara ịna-enwe ọṅụ ma ọ bụ ihe ndị nwere ike ime ka gị na Chineke ghara ịdị ná mma

“Ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa”

37:10, 11

  • Dịrị umeala n’obi, nweekwa ndidi ruo mgbe Jehova ga-akwụsị ahụhụ ị na-ata

  • Na-enyere ụmụnna gị aka. Na-echetara ndị nke dara mbà na ụwa ọhụrụ nke ga-abịa n’oge na-adịghị anya ga-akwụsị nsogbu niile

Alaeze Mesaya ga-emere anyị ọtụtụ ihe ọma