Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ JUN 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Jiri Vidio Na-akụzi Ihe

Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Jiri Vidio Na-akụzi Ihe

IHE MERE O JI DỊ MKPA:

Ndị mmadụ na-ele vidio, ihe ha na-ahụ na ihe ha na-anụ na vidio ahụ na-erukarị ha n’obi. Uche ha niile na-adị n’ihe ahụ ha na-ele, ọ na-esikwa ike ha echefuo ihe ha lere. Jehova ji ihe a na-ahụ anya kụziere ndị ohu ya ihe n’oge ochie.—Ọrụ 10:9-16; Mkpu. 1:1.

E nwere vidio ndị kọwakwuru ihe dị́ n’isi nke abụọ na isi nke atọ nke broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke. Ha bụ: Chineke Ò Nwere Aha?, Uche Ònye Ka E Dere na Baịbụl?, na Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu? E nwekwara vidio ndị nke na-agba ndị mmadụ ume ka anyị na ha mụwa Baịbụl ma ọ bụ ka ha bịawa ọmụmụ ihe anyị. Ha bụ: Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?, Olee Otú Anyị na Ndị Mmadụ Si Amụ Baịbụl?, na Gịnị Ka A Na-eme n’Ụlọ Nzukọ Alaeze? Anyị nwekwara ike iji vidio anyị ndị ọzọ toro ogologo kụziwere mmadụ ihe dị́ na Baịbụl.—km 5/13 3.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Danloduo vidio ị chọrọ iji akụziri mmadụ ihe

  • Kwadebe otu ajụjụ ma ọ bụ abụọ vidio ahụ zara

  • Gị na ya lekọọ vidio ahụ ọnụ

  • Tụleenụ ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị́ na ya

IHE Ị GA-EME:

  • Gosi mmadụ otú ọ ga-esi jiri adres Ịntanet anyị dị na traktị nweta vidio bụ́ Olee Uru Ịmụ Baịbụl Ga-abara Gị?, ma ọ bụ gị egosi ya ihe e sere n’azụ traktị ahụ nke ga-ebuga ya n’ebe vidio ahụ dị

  • Kpọnyere mmadụ vidio bụ́ Olee Ihe Ndị Gosiri na Baịbụl Na-ekwu Eziokwu? Nye ya broshọ Ozi Ọma Si n’Aka Chineke, gosikwa ya isi ihe ndị dị́ n’isi nke 3