Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ JULAỊ 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Anyị Ga-enwe Ike Ịna-eto Chineke ma Ọ Bụrụ na Anyị Anaghị Ebi Ndụ Okomoko

Anyị Ga-enwe Ike Ịna-eto Chineke ma Ọ Bụrụ na Anyị Anaghị Ebi Ndụ Okomoko

Nweta nke a nweta nke a nwere ike ime ka anyị ghara ịna-enwe ohere. Ịzụ ihe, ilekọta ihe anyị zụrụ, iji ihe ahụ na-eme ihe anyị ji maka ya zụta ya, na-ewe ma oge ma ike. Ndụ okomoko Jizọs na-ebighị mere ka ihe onwunwe ghara imegharị ya anya mgbe ọ bịara n’ụwa.—Mat. 8:20.

Gịnị ka i nwere ike ime ka i nwee ike ijekwuru Jehova ozi? Ùnu nwere ike ịhazi ihe ụfọdụ n’ezinụlọ unu ka otu onye nwee ike ịbanye n’ọrụ ịsụ ụzọ? Ọ bụrụ na ị banyela n’ozi oge niile, ì jirila nwayọọ nwayọọ na-achọ ka i nwetachaa ihe niile e ji ebi ndụ, ya emee ka ị ghara ịna-enwe ohere? Ọ bụrụ na anyị anaghị ebi ndụ okomoko, ihe ọ bụla anyị nwere ga-eju anyị afọ, ozi anyị na-ejere Jehova ga na-atọkwa anyị ezigbo ụtọ.—1 Tim. 6:7-9.

Dee ihe ndị ị ga-eme ka ị ghara ịna-ebi ndụ okomoko.