Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ JULAỊ 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Otú Ọsụ Ụzọ Ga-esi Na-arụzu Awa Ya

Otú Ọsụ Ụzọ Ga-esi Na-arụzu Awa Ya

Onye chọrọ ịsụ ụzọ oge niile ga-ebu ụzọ hazie oge ya nke ọma. Ọ bụrụ na ị ga-arụtali awa iri na asatọ kwa izu, ị ga-abụli ọsụ ụzọ oge niile, gị enweekwa oge ị ga-eji na-ezu ike. Ọ bụrụ na ị hazie oge gị nke ọma, ị ga na-arụzu awa gị n’agbanyeghị mmiri ozuzo ma ọ bụ ọrịa. Ihe dị́ n’okpuru ebe a nwere ike inyere ndị chọrọ ịsụ ụzọ aka ịna-arụzu awa ha n’agbanyeghị ma hà ji ụbọchị niile dị n’izu akpa afọ ha ma ọ̀ bụ na ha ejighị, ma ahụ́ ọ̀ gbasiri ha ike ma ọ bụ na ahụ́ na-enyetụ ha nsogbu. Unu hazie ihe ụfọdụ n’ezinụlọ unu, otu onye n’ime unu nwere ike ịmalite ịsụ ụzọ n’ọnwa Septemba. Unu nwedịrị ike ikwurịta ya n’ofufe ezinụlọ unu.

ANAGHỊ M AGA ỌRỤ ỤBỌCHỊ NIILE

Mọnde

ỌRỤ

Tuzdee

ỌRỤ

Wenezdee

ỌRỤ

Tọzdee

Awa isii

Fraịdee

Awa isii

Satọdee

Awa anọ

Sọnde

Awa abụọ

M NA-AGA ỌRỤ ỤBỌCHỊ NIILE

Mọnde

Awa abụọ

Tuzdee

Awa abụọ

Wenezdee

ỌMỤMỤ IHE ETITI IZU

Tọzdee

Awa abụọ

Fraịdee

Awa abụọ

Satọdee

Awa isii

Sọnde

Awa anọ

AHỤ́ ADỊCHAGHỊ M

Mọnde

ỤBỌCHỊ M JI EZU IKE

Tuzdee

Awa atọ

Wenezdee

Awa atọ

Tọzdee

Awa atọ

Fraịdee

Awa atọ

Satọdee

Awa atọ

Sọnde

Awa atọ