Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ JENỤWARỊ 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Ịrụ na Ilekọta Ebe Ndị Anyị Na-anọ Efe Chineke Bụ Ihe Ọma Chineke Meere Anyị

Ịrụ na Ilekọta Ebe Ndị Anyị Na-anọ Efe Chineke Bụ Ihe Ọma Chineke Meere Anyị

Mgbe a chọrọ ịrụ ụlọ nsọ na Jeruselem, o nwere ọtụtụ ihe a ga-arụ ga-efu ego buru ibu. Ma, ụmụ Izrel ji obi ha niile kwado ọrụ ahụ. (1 Ihe 29:2-9; 2 Ihe 6:7, 8) Mgbe a rụchara ụlọ ahụ, otú ndị Izrel si na-elekọta ya gosiri ma hà ji ife Chineke kpọrọ ihe ka ọ̀ bụ na ha ejighị ya kpọrọ ihe. (2 Eze 22:3-6; 2 Ihe 28:24; 29:3) Ịrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na Ụlọ Mgbakọ, idewe ha ọcha, na ilekọta ha na-ewe anyị ma oge ma ego. Iso na-arụ ụlọ ndị a bụ ihe ọma na-enweghị atụ Jehova meere anyị, o sokwa n’ozi dị nsọ anyị na-ejere ya.—Ọma 127:1; Mkpu. 7:15.

OTÚ ANYỊ GA-ESI NYE AKA BỤ:

  • Iso na-edebe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha ma a gbasaa ọmụmụ ihe. Ọ bụrụgodị na e nwere ihe mere na ị gaghị eso ndị ọzọ dewe ya ọcha, gbalịa dewe ebe nke ị nọ ọcha.

  • Iso arụ ọrụ mgbe a na-edewe Ụlọ Nzukọ Alaeze ọcha na mgbe a na-arụzi ihe ụfọdụ. Ọ bụrụ na a gbakọọ aka rụọ ya, ọrụ ga-adị mfe, obi ga-adịkwa onye ọ bụla ụtọ.—lv 92-93 ¶18.

  • Inye onyinye. A sịgodị na ihe anyị nyere dị obere, Jehova ga-anabata ya ma ọ bụrụhaala na o si anyị n’obi.—Mak 12:41-44.

  • Iso rụọ ebe anyị na-anọ efe Jehova ma ọ bụrụ na ọ ga-adịrị gị mfe, ya sọkwa ya bụrụ na ị maghị otú e si arụ ụlọ.