Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ FEBỤWARỊ 2016

Febụwarị 1-7

NEHEMAYA 1-4

Febụwarị 1-7
  • Abụ nke 126 na Ekpere

  • Okwu Mmeghe (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE

  • Nehemaya Ji Ofufe Chineke Kpọrọ Ihe”: (Nkeji 10)

    • [Kpọnye vidio bụ́ Ihe Akwụkwọ Nehemaya Na-ekwu.]

    • Nehe. 1:11–2:3—Nehemaya nwere ezigbo ọṅụ n’ihi ọganihu a nọ na-enwe n’ofufe Chineke (w06 2/1 9 ¶7)

    • Nehe. 4:14—Otú Nehemaya si tụkwasị Chineke obi nyeere ya aka imeri ndị na-emegide ndị na-efe Chineke (w06 2/1 10 ¶3)

  • Ihe Anyị Mụtara n’Okwu Chineke: (Nkeji 8)

    • Nehe. 1:1; 2:1—Olee otú o si bụrụ na anyị nwere ike ikwu na ọ bụ otu ebe ka e si gụwa ‘afọ nke iri abụọ’ ahụ e kwuru okwu ya na Nehemaya 1:1 na 2:1? (w06 2/1 8 ¶5)

    • Nehe. 4:17, 18—Olee otú mmadụ ga-esi jiri naanị otu aka na-ewughachi mgbidi? (w06 2/1 9 ¶1)

    • Gịnị ka ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a gbasara Jehova?

    • Olee ihe ị mụtara n’ọgụgụ Baịbụl nke izu a nke ị ga-eji zie ndị mmadụ ozi ọma?

  • Ọgụgụ Baịbụl: Nehe. 3:1-14 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)

MỤTAKWUO IZI OZI ỌMA NKE ỌMA

  • Otú Anyị Ga-esi Zie Ndị Mmadụ Ozi Ọma n’Ọnwa A: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-ebu ụzọ kpọnye vidio nke ọ bụla iji gosi otú anyị ga-esi ezi ndị mmadụ ozi ọma. E kirichaa nke ọ bụla, a tụlee ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị na ya nakwa otú onye nkwusa e gosiri na ya si kwulite ihe ya na onye o ziri ozi ọma ga-atụle n’oge ọzọ. Gbaa ụmụnna ume ka ha dee otú ọzọ ha nwere ike isi zie mmadụ ozi ọma.

OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

  • Abụ nke 103

  • Kwadebe Maka Ịsụ Ụzọ Inyeaka n’Ọnwa Mach ma Ọ Bụ n’Ọnwa Eprel: (Nkeji 15) Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-atụle ihe ndị gbara ọkpụrụkpụ dị́ n’isiokwu bụ́ “Ihe Ga-eme Ka Obi Dịkwuo Anyị Ụtọ n’Oge A Na-echeta Ọnwụ Jizọs.” (km 2/14 2) Chetara ụmụnna ihe mere anyị ji kwesị ịhazi oge anyị tupu ọnwa Mach na Eprel eruo. (Ilu 21:5) A ga-agba ndị nkwusa abụọ ajụjụ ọnụ. Ha ga-abụ ndị sụrụ ụzọ inyeaka n’oge gara aga. Olee nsogbu ndị ha meriri tupu ha enwee ike ịsụ ụzọ? Olee ihe ndị mere ha obi ụtọ n’oge ahụ?

  • Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: ia isi nke 8 ¶1-16 (Nkeji 30)

  • Ịchịkọta ihe a mụrụ n’ọmụmụ ihe na ikwu ihe a ga-amụ n’izu ọzọ (Nkeji 3)

  • Abụ nke 135 na Ekpere