Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ FEBỤWARỊ 2016

Ihe I Nwere Ike Ikwu

Ihe I Nwere Ike Ikwu

TETA!

Ajụjụ: Gịnị ka i chere ga-eme okpukpe ụgha n’ọdịnihu?

Amaokwu Baịbụl: Mkpu. 18:8

Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu a ga-akọwakwuru gị gbasara ihe a Baịbụl kwuru. [Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 3-6.]

TETA!

Ajụjụ: Gịnị ka i chere ga-enyere ezinụlọ aka ịna-ebi n’udo?

Amaokwu Baịbụl: Kọl. 3:13

Otú a ga-esi enye ya: Isiokwu a ga-akọwakwuru gị ihe ndị ọzọ ga-enyere ezinụlọ aka ịna-ebi n’udo. [Gosi ya isiokwu dị na peeji nke 12-13.]

GEE CHINEKE NTỊ

Ajụjụ: Ọ̀ ga-amasị gị ibi n’ụwa mara mma ka nke a e sere ebe a? [Gosi ya peeji nke 2-3, gị echere ka ọ zaa.]

Amaokwu Baịbụl: Jere. 29:11

Otú a ga-esi enye ya: Akwụkwọ a kwuru otú anyị ga-esi gee Chineke ntị ka anyị nwee ike inweta ihe ọma ndị o kwuru na ya ga-emere anyị n’ọdịnihu. [Tụleenụ peeji nke 4-5.]

DEE OTÚ ỌZỌ Ị GA-ESI JIRI OTU N’IME AKWỤKWỌ NDỊ A ZIE OZI ỌMA

Jiri aro ndị a dị́ ebe a dee otú ọzọ ị ga-achọ isi jiri akwụkwọ ndị a zie ozi ọma.