Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ DISEMBA 2016

 OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ

Jiri Akwụkwọ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke” Ruo Ndị Mmadụ n’Obi

Jiri Akwụkwọ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke” Ruo Ndị Mmadụ n’Obi

IHE MERE O JI DỊ MKPA: Ndị mmadụ kwesịrị ịmata ihe Jehova chọrọ ka ha na-eme, ma na-eme ya. Ọ bụ ya ga-eme ka ọ nabata ofufe ha. (Aịza. 2:3, 4) Akwụkwọ nke abụọ anyị ji amụrụ ndị mmadụ ihe bụ́ “Nọrọnụ n’Ịhụnanya Chineke,” ga-enyere ndị anyị na-amụrụ ihe aka ịmata ihe bụ́ uche Chineke n’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị. (Hib. 5:14) Anyị kwesịrị ịgbalị ruo ha n’obi mgbe anyị ji akwụkwọ a na-amụrụ ha ihe n’ihi na ọ bụ ya ga-eme ka ha mata na ọ dị mkpa ka ha gbanwee ihe ụfọdụ ná ndụ ha.—Rom 6:17.

OTÚ Ị GA-ESI EME YA:

  • Kwadebe ihe unu ga-amụ nke ọma. Burukwa mkpa onye ị na-amụrụ ihe n’obi mgbe ị na-akwadebe ya. Kwadebekwa ajụjụ ndị ị ga-ajụ ya iji chọpụta ihe bụ́ echiche ya gbasara ihe unu na-amụ.—Ilu 20:5; be 259

  • Jiri igbe ndị dị n’akwụkwọ ahụ mee ka ọ ghọta uru ime ihe Baịbụl kwuru ga-abara ya

  • Nyere onye ị na-amụrụ ihe aka ichebara ihe ndị Akwụkwọ Nsọ na-enyeghị iwu ọ bụla gbasara ha echiche, tupu ya ekpebie ihe ọ ga-eme. Ekpebikwarala ya ihe ọ ga-eme.—Gal. 6:5

  • Jiri akọ chọpụta ma ò nwere ihe ndị Baịbụl kwuru na-esiri ya ike ime. Gbazie ya ume ka ọ gbalịa mee ihe ndị ahụ n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe Jehova nọ.—Ilu 27:11; Jọn 14:31