Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

USORO IHE OMUME—OZI ANYỊ NA OTÚ ANYỊ SI EBI NDỤ DISEMBA 2016

 AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | AỊZAYA 11-16

Ihe Ọmụma Jehova Ga-ejupụta Ụwa

Ihe Ọmụma Jehova Ga-ejupụta Ụwa

Otú amụma a si mezuo n’oge ụmụ Izrel

  • Ndị Izrel atụghị ụjọ ihe ọ bụla ma mgbe ha si Babịlọn bụ́ ebe a dọọrọ ha n’agha na-alọta, ma mgbe ha lọghachịrị biri n’ala ha. Ha atụghị ụjọ ihe ọ bụla ma anụ ọhịa ma ndị mmadụ na-akpa àgwà ka anụ ọhịa.—Ezra 8:21, 22

Otú amụma a si na-emezu n’oge anyị a

  • Ịmụta banyere Jehova emeela ka ọtụtụ ndị gbanwee ndụ ha. Ụfọdụ ndị na-emebu ihe ike aghọọla ndị na-eme udo. Okwu Chineke emeela ka ndị Chineke n’ụwa niile dịrị n’udo

Otú amụma a ga-esi mezuo n’ọdịnihu

  • Ụwa niile ga-aghọ paradaịs ebe udo na obi iru ala ga-adị otú ahụ Chineke chọburu ka ọ dịrị. O nweghị onye ọ bụla ma ọ bụ anụmanụ ọ bụla ga-eme ka ndị nọ́ na ya tụọ egwu

Okwu Chineke mere ka Pọl gbanwee ndụ ya

  • Mgbe ọ ka bụ onye Farisii, ọ kpara àgwà ka anụ ọhịa.—1 Tim. 1:13

  • Okwu Chineke mere ka ọ gbanwee àgwà ya bụrụzie ezigbo mmadụ.—Kọl. 3:8-10