Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ—Abụ Ọhụrụ

 Abụ 143

Ìhè Na-enwu n’Ụwa A Gbara Ọchịchịrị

Ìhè Na-enwu n’Ụwa A Gbara Ọchịchịrị

Danloduo ya:

(2 Ndị Kọrịnt 4:6)

  1. N’ụw’ọjọọ a gbar’ọchịchịrị,

    Anyị n’ahụ ìhè.

    Ọ dị ka mgbe chi n’abọ,

    Ìhè n’emecha dị.

    (KORỌS)

    Ọchịchịrị gbara.

    M’ozi ọm’anyị n’eny’ìhè.

    Ọ n’eny’olileanya.

    Ọ n’enwu k’anyanwụ,

    N’eme k’ọchịchịrị laa,

    Anyị ah’ụzọ.

  2. K’a kpọtee ndị n’ehi ụra

    N’ihi n’oge agwụla.

    A’yị n’ezi h’ozi n’agb’ume,

    N’arịọ ka ha dị ndụ.

    (KORỌS)

    Ọchịchịrị gbara.

    M’ozi ọm’anyị n’eny’ìhè.

    Ọ n’eny’olileanya.

    Ọ n’enwu k’anyanwụ,

    N’eme k’ọchịchịrị laa,

    Anyị ah’ụzọ.