Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ—Abụ Ọhụrụ

 Abụ 146

Unu Meere M Ya

Unu Meere M Ya

Danloduo ya:

(Matiu 25:34-40)

  1. Atụrụ ọzọ nke Kraịst so ndị e tere ’manụ,

    bụ́ ndị Jizọs g’alụ, n’arụk’ọrụ ọnụ.

    Jizọs Kraịst g’akwụ anyị ụgwọ

    mak’ilekọta

    ndị e tere ’manụ n’ịkasi h’obi.

    (KORỌS)

    “Unu kasie h’obi, unu kasiri m.

    Ihe unu meere ha, unu meere m ya.

    Ọ bụ m k’unu gbaara mbọ unu gbaara ha.

    Unu meere ha, unu meere m ya.

    Ihe unu meere ha, unu meere m ya.”

  2. “Unu nyere mụ nri n’oge niil’agụụ ji m,

    Unu dum gbokwaara m mkpa m ọ bụla.”

    Ha g’ajụ ya mgbe ha ji

    meere y’ihe ndị a.

    Eze anyị bụ́ Jizọs Kraịst g’asịkwa ha:

    (KORỌS)

    “Unu kasie h’obi, unu kasiri m.

    Ihe unu meere ha, unu meere m ya.

    Ọ bụ m k’unu gbaara mbọ unu gbaara ha.

    Unu meere ha, unu meere m ya.

    Ihe unu meere ha, unu meere m ya.”

  3. “Unu gere mụ ntị, rụọ kw’ọtụtụ ọrụ ọma.

    Unu sokw’ụmụnna m kwusaa ozi ọma.”

    Eze anyị g’agwa ndị

    nọ́ ya n’aka nri, sị:

    “Ketanụ ndụ ebigh’ebi n’ụw’ọhụrụ.”

    (KORỌS)

    “Unu kasie h’obi, unu kasiri m.

    Ihe unu meere ha, unu meere m ya.

    Ọ bụ m k’unu gbaara mbọ unu gbaara ha.

    Unu meere ha, unu meere m ya.

    Ihe unu meere ha, unu meere m ya.”