Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 33

Unu Atụla Ha Egwu!

Unu Atụla Ha Egwu!

(Matiu 10:28)

1. N’aga n’ihu, unu ndị nke m,

K’ozi ọma n’aga n’ihu.

Atụl’egwu nd’iro.

Ka ndị n’achọ eziokwu nụ

N’Ọkpara m, Kraịst Jizọs, bụ́ Eze,

Chụdar’ony’iro n’ụwa.

Ọ g’eke Ekwensu agbụ,

Tọpụ ndị o ker’agbụ.

(KORỌS)

Ezigb’ụmụ m, atụl’egwu

N’ihi iyi egwu ha.

M g’echebe ezi ndị ohu m

Dị ka mkpụrụ anya m.

2. Nd’iro unu dị ọtụtụ,

N’eyi egwu, n’ekwutọ unu.

Ha n’ej’ire ụtọ n’ọchị

N’achọ ịghọgbu unu.

Ndị agha m tụkwasịr’obi,

Atụkwala ha egwu,

Mụ onwe m g’echebe unu,

Mee ka unu nwee mmeri.

(KORỌS)

Ezigb’ụmụ m, atụl’egwu

N’ihi iyi egwu ha.

M g’echebe ezi ndị ohu m

Dị ka mkpụrụ anya m.

 3. Echela n’echefuola m gị;

Abụ m ike na ọta gị.

A sị n’ị nwụọ n’ọgbọ agha,

Aga m akpọlite gị.

Atụl’egwu ndị n’egbu ahụ́,

H’apụgh’igbu mkpụr’obi.

Jid’okwukwe gị ru’ọgwụgwụ;

M g’enye gị ụgw’ọrụ!

(KORỌS)

Ezigb’ụmụ m, atụl’egwu

N’ihi iyi egwu ha.

M g’echebe ezi ndị ohu m

Dị ka mkpụrụ anya m.