Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 78

Ogologo Ntachi Obi

Ogologo Ntachi Obi

(Ndị Galeshia 5:22)

1. Onyenw’anyị Jehova,

N’anụr’aha y’ọkụ n’obi.

Ọ chọsikwara ike

Ime ka aha ya dị nsọ.

Kemgbe ọtụtụ ọgbọ,

O nwere ndidi dị ukwuu;

N’ogologo ntachi obi,

Ike agwụbeghị ya.

Ọ chọrọ k’a zọpụta

Ụdị ’madụ niile n’ụwa.

Ntachi obi Chineke

Agaghị abụ ih’efu.

2. A’yị g’enwe ntachi obi

Iji n’efe Chinek’anyị.

Obi g’eru anyị ala,

K’anyị ghar’iwe iw’ọkụ.

Hụ àgw’ọma ndị ọzọ nwere,

N’atụ any’ihe kacha mma.

Obi jọọ anyị njọ,

A’yị g’eguzos’ike.

Ntachi obi g’eme ka

Anyị ṅomie Chinek’anyị,

Nwee àgw’ọma ndị ọzọ

’Mụọ nsọ n’eme ka anyị nwee.