Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 130

Ndụ Bụ Ọrụ Ebube

Ndụ Bụ Ọrụ Ebube

(Abụ Ọma 36:9)

1. Nw’ọhụr’ọ bụla, na ‘mir’ozuzo,

Ọmarịcha anyanwụ Na mkpụrụ dum

Bụ onyinye Jaa N’egosi ụzọ ya.

Ọrụ ebube ya baar’anyị uru kw’ụbọchị.

(KORỌS)

A’yị g’eji onyinye ahụ n’enweghị atụ

Hụ Onye nyere ya n’anya, ma n’ekele ya.

Ihe ọ sọr’anyị mee, O rughịrị anyị.

Ihe a bụ onyinye—Ndụ bụ ọrụ ebube.

2. Ụfọdụ ndị Pụr’ịda mbà,

Ha n’ekwu ka nwunye Job: ‘Kọchaa Jaa, nwụọ.’

Anyị dị iche. Anyị n’eto Jaa,

A’yị n’ekele ya n’ihi ndụ o nyer’anyị.

(KORỌS)

A’yị g’eji onyinye ahụ n’enweghị atụ

Hụ ’madụ ibe anyị n’anya, n’enyere h’aka.

Ihe ọ sọr’anyị mee, O rughịrị anyị.

Ihe a bụ onyinye—Ndụ bụ ọrụ ebube.