Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 121

Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

(Ndị Hibru 10:24, 25)

1. K’anyị n’agbarịt’ibe anyị ume

Ịnọs’ike n’ofufe Jaa,

Ịhụnany’anyị n’esikwu ike;

Ezi ọrụ n’ewet’udo.

Ịhụnany’anyị hụr’ibe anyị

N’agb’anyị ume ịtachi obi.

Ọgbakọ bụ ebe mgbab’anyị,

Ebe obi g’eru anyị ala.

2. Okwu e kwuru n’oge dị mma

N’akasi anyị niile obi!

Anyị n’anụ okwu nkasi obi ndị a

N’ọnụ ezigbo ndị enyi anyị.

Ọ dị mma k’anyị n’ụmụnn’anyị

N’arụk’ọrụ n’ịdị n’otu!

Anyị n’agba ụmụnn’anyị ume,

Nyere h’aka ná nsogbu ha.

3. K’anyị ji anya okwukwe n’ahụ

N’ụbọchị Jehova dị nso,

Anyị kwesịrị ịn’ezukọ,

K’anyị nọsi’ike n’ozi ya.

Anyị niile bụ́ ndị Jehova

Chọr’ife ya ru’ebigh’ebi.

Anyị n’agbarịt’ibe anyị ume

Ijisi okwukwe anyị ike.