Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 35

Ikele Chineke Maka Ndidi Ya

Ikele Chineke Maka Ndidi Ya

(2 Pita 3:15)

1. Jehova, ike gị dị ukwuu,

Ị hụr’ezi ihe n’anya.

Aj’omume juru n’ụwa,

Anyị ma n’ọ n’ewute gị.

Ụfọdụ chere n’ị n’egbu oge;

Mgbe ị g’akwụs’ihe ọjọọ dị nso.

Anyị tụkwasịrị gị obi,

Ndidi gị n’atọ anyị ụtọ.

2. Otu puku afọ gar’aga

Dị k’otu ’bọchị n’anya gị.

Oké ụbọchị gị dị nso;

Ọ g’abịa n’egbughị oge.

Aj’omume n’ewe gị iwe,

Nchegharị n’atọ gị ụtọ.

Olil’any’anyị sir’ike,

A’yị n’ekele gị, n’eto aha gị.