Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 45

Gaa n’Ihu!

Gaa n’Ihu!

(Ndị Hibru 6:1)

1. Gaa n’ihu, gaa n’ihu ruo n’itozu okè!

Ọ b’uche Chineke k’anyị nwet’amamihe.

Gbalịsie ike mee k’ozi gị ka mma,

Jaa g’agọzi ọrụ gị.

Ọrụ ahụ dịịrị ’madụ niile.

Cheta na Jizọs Kraịst rụrụ ya.

Tụkwasị Chinek’obi k’ị ghar’ịda,

Nọsi’ike n’ezi omume.

2. Gaa n’ihu, gaa n’ihu n’atụghị egwu!

Kwusaara ’madụ dum ozi ọma ebigh’ebi.

Soro n’eto Jehova, Chinek’anyị.

Kwusaa ya n’ụlọ n’ụlọ.

Nd’iro chọr’imeny’anyị ụjọ.

Alal’azụ, k’onye ọ bụla nụ

Ozi ọṅụ n’Al’eze Chineke dị nso.

Kụzikwuo eziokwu ya.

3. Gaa n’ihu, gaa n’ihu, gaghachi mgbe dum,

N’emezi ozi gị; ọrụ a g’arụ dị ukwuu.

Kwe ka ’mụọ nsọ Chineke n’akpali gị.

Nweta ọṅụ Jaa n’enye.

Hụ ndị i zir’ozi ọma n’anya.

N’eleta ha, k’i ruo ha n’obi.

Nyere h’aka ime nk’ọma kw’ụbọchị,

Ka ìhè eziokwu nwuo.