Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 13

Ekpere E Ji Ekele Chineke

Ekpere E Ji Ekele Chineke

(Abụ Ọma 95:2)

1. Jaa, Onye amara, kwesịr’otuto;

Ọkaakaa, ọ bụ gị k’anyị n’eto.

Ị bụ Ony’ukwu n’anụ ekpere,

Anyị chọrọ k’ị n’elekọt’anyị.

Anyị n’emehie n’ihi adịgh’ike;

Anyị n’arịọ k’ị gbaghara anyị.

I ji ọbar’Ọkpara gị zụt’anyị.

Anyị chọrọ k’ị kụzier’any’ihe.

2. Ọṅụ n’adịrị ndị batara

N’eb’ị n’ezi ihe na n’ìhè gị.

Zi any’ihe; k’Okwu gị duo anyị.

Anyị chọr’ibi n’ụlọ nsọ gị.

Aka gị siri ike dị egwu,

Ọ n’enye ndị gị obi ike.

Nna, anyị n’eto Al’eze gị.

Anyị g’ekwusa ya, ọ gagh’ada.

3. Ka nlekọta gị nye anyị ọṅụ;

Ka ofufe gị zuo ụwa niile.

Al’eze gị g’eweta ih’ọma,

Wepụ ọrịa, ọnwụ, n’anya ’miri.

Nwa gị g’ebibi ih’ọjọọ niile;

Ndị ị gọziri g’enwe ọṅụ.

Ka anyị bụọ abụ mmeri, sị:

“Toonụ Jehova, bụ́ Eze anyị!”