Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 3

“Chineke Bụ Ịhụnanya”

“Chineke Bụ Ịhụnanya”

(1 Jọn 4:7, 8)

1. Chineke bụ ịhụnanya.

Ọ sị, ‘So m, h’ụzọ m n’anya.’

Ịhụ Jaa n’ibe anyị n’anya

G’ewetar’any’ih’ọma.

Ọ bụ is’ihe dị ná ndụ,

Ụdị ndụ anyị chọrọ.

Ụd’ịhụnanya nke Kraịst

K’a g’eji mara anyị.

2. Ịhụ Jaa n’eziokwu n’anya

N’ezi anyị ịhụnanya.

Jaa g’enye aka m’anyị daa;

Ọ g’eme k’anyị bilie.

Ịhụnany’enwegh’ekworo;

Ọ n’edi ihe niile.

K’anyị h’ụmụnn’anyị n’anya,

Rit’uru n’ịhụnanya.

3. Ekwela k’iwe n’achị gị;

Ekwela k’o jide gị.

Tụkwasị Chineke obi;

Ọ g’ezi gị iwu ya:

Ịhụ Jaa n’ibe anyị n’anya,

Ihe bụ́ ịhụnanya.

N’obiọma, gosi ndị ọzọ

Ịhụnanya Chineke.