Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 61

Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ

Ụdị Mmadụ M Kwesịrị Ịbụ

(2 Pita 3:11)

1. Jehova, gịnị ka m g’eji kwụọ gị ụgwọ,

Keleekwa gị maka ndụ nke i nyere m?

M ji Okwu gị enyocha onwe m k’enyo;

Mee ka m ghọt’ụdị ’madụ m bụ nke ọma.

M kwere nkwa iji ndụ m je’ozi gị,

Ozi m agagh’abụ iji mezuo iwu.

M kpebir’iji obi m dum jeere gị ozi.

Ka m soro mee ka obi gị ṅụrịa.

2. Nyere m ak’inyocha onwe m ma ghọta

Ụdị ’madụ ị chọrọ ka mụ onwe m bụrụ.

Ị gagh’ahapụ ndị n’eme uche gị;

Ka m soro ná ndị n’eme k’obi gị ṅụrịa.