Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 126

Ọrụ Anyị Ji Ịhụnanya Rụọ

Ọrụ Anyị Ji Ịhụnanya Rụọ

(Abụ Ọma 127:1)

1. Jehova, og’eruola;

A’yị ji obi dum n’ekele gị.

Anyị apụgh’ikwucha ih’ùgwù

I nyere anyị!

I si n’el’igwe gọzie

Ọrụ anyị ji ’hụnanya rụọ.

Ụlọ a anyị rụrụ n’egosi

N’ị gọzir’anyị.

(KORỌS)

Chinek’anyị, ọ bụ ih’ùgwù

Ịrụrụ gị ụlọ nke a.

K’anyị jiri ndụ anyị niile jeere gị ozi,

Too gị n’ihe dum a’yị n’eme.

2. Obi dị anyị niil’ụtọ,

Anyị aghọọla ezi ndị enyi!

Ihe a dum k’anyị ga n’echeta

Ruo ebigh’ebi!

Nna, ’mụọ gị dur’anyị

N’ọrụ a’yị ji otu obi rụọ.

A’yị mere k’aha gị dị ukwuu;

Ọ bụ ngọzi gị!

(KORỌS)

Chinek’anyị, ọ bụ ih’ùgwù

Ịrụrụ gị ụlọ nke a.

K’anyị jiri ndụ anyị niile jeere gị ozi,

Too gị n’ihe dum a’yị n’eme.