Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 135

Ịtachi Obi Ruo Ọgwụgwụ

Ịtachi Obi Ruo Ọgwụgwụ

(Matiu 24:13)

1. Okwu Chineke na nkwa ya

N’eme k’a tachi’obi.

Ihe niile ị mụtara

Zir’ezi, bụr’eziokwu.

Nọsi’ike n’okwukwe dị nsọ,

Bur’ụbọchị Jaa n’obi.

Guzosie ike n’ez’ihe;

Ọnwụnwa g’anụcha gị.

2. Jigid’ịhụnanya mbụ gị,

Ọ pụrụ ịjụ oyi.

N’agbanyegh’ọnwụnwa gị dum,

Gbalịsi’ike tachi’obi.

N’ọnwụnw’ọ bụla bịaara gị,

Atụl’egwu, nwe’ob’ike.

Jaa g’emere gị ụzọ mgbapụ,

Ọ g’anọ gị nso mgbe dum.

3. Anyị tachi’obi ru’ọgwụgwụ,

A g’azọpụt’anyị.

A g’ede ah’anyị nk’ọma

N’akwụkwọ nke ndụ.

Kpebisi’ike ịtachi obi;

Kwee k’ọ rụzuo ọrụ ya.

Jehova g’agọzikwa gị;

Ị g’enw’ezigbo ọṅụ.