Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 98

Ịgha Mkpụrụ Alaeze

Ịgha Mkpụrụ Alaeze

(Matiu 13:4-8)

1. Bịanụ, unu ndị ohu Jehova,

Ndị ji obi dum n’ej’ozi.

Bịanụ rụọ ọrụ Nn’anyị ukwu,

Mụtanụ iso nz’ụkwụ ya.

Ghaanụ mkpụr’eziokwu n’atụgh’egwu

N’obi ndị g’amị mkpụrụ,

Nye Jaa otuto n’ịrụsi ọrụ ike.

Rụzuokwa ọr’unu n’ozi ubi.

2. Ụfọdụ mkpụr’unu pụr’ịda

N’obi sir’ike ka nkume.

Ha pụr’ịnabata ya na mbụ,

M’a g’am’ihe ha bu n’obi.

A kpagbu’okwu ahụ, any’ukwu anọchie;

Ha n’ahọr’ịchụ ihe ụwa.

Ị g’ahụ mkpụrụ ndị mere nk’ọma

N’ala dị mma, nke bụ́ ezi ala.

3. Mgbalị gị n’ozi gị pụrụ

Ime k’i nwee ọganihu.

Ndidi n’ịhụnanya pụrụ

Imegh’obi ndị agbat’obi.

Ị mụr’anya ma nwee obi ike,

Ị g’eme ka ụjọ ha laa.

Ị g’el’anya iji ọṅụ ghọọ mkpụrụ

Iri atọ m’ọ bụ otu narị.

(Gụọkwa Mat. 13:19-23; 22:37.)