Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Bụkuo Jehova Abụ

 Abụ nke 1

Àgwà Jehova

Àgwà Jehova

(Mkpughe 4:11)

1. O, Jehova, onye kas’ike,

Ị bụ is’iyi nke ndụ na ìhè.

Ihe dum i kere n’akọ ike gị;

Ụbọchị gị g’akọkwu ya.

2. Och’eze gị bụ ikpe zir’ezi,

Iwu ọma gị k’ị n’egosi anyị.

K’anyị n’agụ Okwu gị, a’yị n’ahụ

Na i nwere amamihe.

3. Ịhụnanya bụ àgwà gị kacha.

I nyer’anyị onyinye dị ukwuu.

Àgwà gị na aha gị dị ebube.

A’yị g’eji ọṅụ n’ekwusa ya.