Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Zekaraya 9:1-17

9  Ozi gbara ọkpụrụkpụ:+  “Okwu Jehova kwuru bụ megide ala Hedrak, ọ ga-emezukwa n’isi Damaskọs;+ n’ihi na anya Jehova dị n’ebe ụmụ mmadụ nọ+ nakwa n’ebe ebo niile nke Izrel nọ;  ọ bụkwa megide Hemat,+ nke ya na ya gbara ókè, megide Taya+ na Saịdọn,+ n’ihi na ọ maara ihe nke ukwuu.+  Taya wee maara onwe ya ékpè, kpokọọ ọlaọcha dị ka ájá, kpokọọkwa ọlaedo dị ka apịtị dị n’okporo ámá.+  Lee! Jehova ga-anapụ ya ihe niile o nwere, gbuo ndị agha ya n’oké osimiri;+ ọkụ ga-erepịakwa ya.+  Ashkelọn ga-ahụ nke a wee tụọ egwu; Geza ga-enwekwa oké ihe mgbu; Ekrọn+ ga-enwekwa oké ihe mgbu n’ihi na ihere ga-eme ebe olileanya ya dị.+ Eze ga-anwụkwa na Geza, mmadụ agaghịkwa ebi n’Ashkelọn.+  Nwa a kwatara n’iko+ ga-ebichi Ashdọd,+ m ga-ebipụkwa mpako nke onye Filistia.+  M ga-ewepụ ihe niile ọbara tetọrọ nke dị ya n’ọnụ, wepụkwa ihe arụ niile dị ya n’ezé,+ ya onwe ya ga-afọdụrụ Chineke anyị; ọ ga-adịkwa ka onyeisi+ n’ime Juda,+ Ekrọn ga-adịkwa ka onye Jibọs.+  M ga-abụrụ ụlọ m onye nche,+ ka ọ ghara inwe onye ga-esi na ya gafere, ka ọ gharakwa inwe onye ga-abataghachi na ya; onyeisi ọrụ agakwaghị esi n’etiti ha gafere,+ n’ihi na ejiriwo m anya m hụ ya ugbu a.+  “Ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu, gị ada bụ́ Zayọn.+ Tie mkpu mmeri,+ gị ada bụ́ Jeruselem. Lee! Eze gị+ na-abịakwute gị.+ Ọ bụ onye ezi omume, ee, onye a zọpụtara azọpụta;+ ọ dị umeala n’obi,+ ọ nọkwa n’elu ịnyịnya ibu, ọbụna anụmanụ tojuru etoju, bụ́ nwa nke nne ịnyịnya ibu.+ 10  M ga-ebipụ ụgbọ ịnyịnya agha n’Ifrem, bipụkwa ịnyịnya na Jeruselem.+ A ga-ebibikwa ụta agha.+ Ọ ga-agwa mba dị iche iche okwu udo;+ ọchịchị ya ga-esi n’oké osimiri ruo n’oké osimiri, sikwa n’osimiri Yufretis ruo na nsọtụ ụwa.+ 11  “Ma gị onwe gị, Zayọn, m ga-esite n’ọbara nke ọgbụgba ndụ+ mụ na gị mee ka ndị gị a tụrụ mkpọrọ+ si n’olulu mmiri na-adịghị pụta. 12  “Laghachinụ n’ebe e wusiri ike,+ unu ndị mkpọrọ nwere olileanya.+ “Taa, ana m asị gị, ‘Zayọn, m ga-akwụ gị ụgwọ okpukpu abụọ.+ 13  M ga-ese Juda dị ka ụta m. M ga-etinye Ifrem n’ụta m, kpọteekwa ụmụ gị,+ gị Zayọn, ka ha megide ụmụ gị, gị Gris,+ m ga-emekwa ka ị dị ka mma agha nke dike.’+ 14  Jehova ga-eme ka a mara na ya nọnyeere ha,+ ọ ga-agbapụkwa ụta ya dị ka àmụ̀mà.+ Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova ga-afụ opi,+ ọ ga-esoro ifufe nke ebe ndịda gaa.+ 15  Jehova nke ụsụụ ndị agha ga-echebe ha, ha ga-eripịa nkume èbè, meriekwa ya.+ Ha ga-aṅụ ihe ọṅụṅụ,+ na-eme mkpọtụ, dị ka à ga-asị na ọ bụ mmanya ka ha ṅụrụ; ha ga-eju n’ọnụ dị ka ọkwá, dị ka nkuku nke ebe ịchụàjà.+ 16  “Jehova bụ́ Chineke ha ga-azọpụta ha+ n’ụbọchị ahụ dị ka ìgwè atụrụ nke ndị ya;+ n’ihi na ha ga na-egbuke egbuke n’ala ya dị ka nkume ndị dị n’okpueze.+ 17  Lee ka ịdị mma ya si dị ukwuu,+ leekwa ka ịma mma ya si dị ukwuu!+ Ọ bụ nri ga-eme ka ụmụ okorobịa na-eme nke ọma, mmanya ọhụrụ ga-emekwa ka ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke na-eme nke ọma.”+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji