Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Zekaraya 7:1-14

7  O wee ruo n’afọ nke anọ nke ọchịchị Eze Darayọs,+ na okwu Jehova ruru Zekaraya ntị, n’abalị anọ n’ọnwa nke itoolu, ya bụ, n’ọnwa Kislev.+  Betel wee zipụ Shariza nakwa Rigem-melek na ndị ikom ya ka ha gaa mee ka obi Jehova jụrụ,+  ka ha jụọkwa ndị nchụàjà+ na-arụ ọrụ n’ụlọ Jehova nke ụsụụ ndị agha nakwa ndị amụma, sị: “M̀ ga-akwa ákwá n’ọnwa nke ise,+ nọrọkwa n’erighị ihe, dị ka m kwara ákwá n’ọtụtụ afọ ndị a?”+  Okwu Jehova nke ụsụụ ndị agha wee ruo m ntị ọzọ, sị:  “Gwa ndị niile bi n’ala a na ndị nchụàjà, sị, ‘Mgbe unu buru ọnụ+ ma kwaa ákwá arịrị n’ọnwa nke ise nakwa n’ọnwa nke asaa,+ meekwa ya ruo afọ iri asaa,+ ọ̀ bụ m n’ezie ka unu buuru ya?+  Mgbe unu riri ihe nakwa mgbe unu ṅụrụ mmanya, ọ́ bụghị unu riri ya, ọ́ bụghịkwa unu ṅụrụ ya?  Ọ̀ bụ na unu ekwesịghị irube isi n’okwu+ Jehova kwuru site n’ọnụ ndị amụma+ oge mbụ, mgbe Jeruselem bụ ebe ndị mmadụ bi, mgbe udo dịkwa na ya, ya na obodo ya niile gbara ya gburugburu, mgbe Negeb+ na Shefila+ bụkwa ebe ndị mmadụ bi?’”  Okwu Jehova wee ruo Zekaraya ntị ọzọ, sị:  “Nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Na-ekpenụ ikpe ziri ezi;+ jirikwanụ obiọma*+ na ọmịiko+ na-emeso ibe unu ihe; 10  unu erigbula nwaanyị di ya nwụrụ+ ma ọ bụ nwa na-enweghị nna,+ onye mbịarambịa+ ma ọ bụ onye nọ n’ahụhụ,+ unu akpakwala nkata n’obi unu ime ibe unu ihe ọjọọ.’+ 11  Ma ha jụrụ ige ntị,+ ha nọ na-eme isi ike,+ ha kpọchisikwara ntị ha ike.+ 12  Ha mere ka obi ha+ dị ka nkume emụri ka ha ghara irube isi n’iwu+ nakwa n’okwu Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru site na mmụọ ya,+ site n’ọnụ ndị amụma oge mbụ;+ Jehova nke ụsụụ ndị agha wee wee oké iwe.”+ 13  “‘Ọ ga-erukwa na dị ka m kpọrọ ha ma ha egeghị ntị,+ otú ahụ ka ha ga-akpọ m ma agaghị m ege ntị,’+ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru. 14  ‘M wee fesasịa ha dị ka oké ifufe ná mba niile+ ha na-amaghị;+ ala ha wee tọgbọrọ n’efu mgbe ha pụsịrị, n’enweghị onye si na ya na-agafe; n’enweghịkwa onye na-alọghachi n’ime ya,+ ha wee mee ka ala ahụ mara mma+ ghọọ ihe ijuanya.’”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Zek 7:9*  Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”