Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Zekaraya 5:1-11

5  M wee lelie anya ọzọ hụ; ma, lee! e nwere akwụkwọ mpịakọta+ na-efe efe.  O wee sị m: “Gịnị ka ị na-ahụ?”+ M wee sị: “M na-ahụ akwụkwọ mpịakọta na-efe efe nke dị kubit iri abụọ n’ogologo, dịkwa kubit iri n’obosara.”  O wee sị m: “Nke a bụ ọbụbụ ọnụ nke na-agagharị n’elu ụwa dum,+ n’ihi na onye ọ bụla nke na-ezu ohi,+ nke bụ́ ihe a bụrụ ọnụ dị ka e kwuru n’ihu akwụkwọ ahụ, anataghị ntaramahụhụ; onye ọ bụla nke na-aṅụ iyi,+ nke bụ́ ihe a bụrụ ọnụ dị ka e kwuru n’azụ akwụkwọ ahụ,+ anataghị ntaramahụhụ.  ‘Emewo m ka o fere gawa,’ ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘ọ ga-abanye n’ụlọ onye ohi nakwa n’ụlọ onye ji aha m na-aṅụ iyi ụgha;+ ọ ga-ebiri ebiri n’ime ụlọ ya wee kpochapụ ya na osisi ya nakwa nkume ya.’”+  Mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu wee bịakwute m, sị: “Biko, lelie anya, hụ ihe ihe a nke fe na-aga bụ.”  M wee sị: “Gịnị ka ọ bụ?” O wee sị: “Ọ bụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa fe na-aga.” O wee gaa n’ihu ịsị: “Nke a bụ otú ndị ajọ omume dị n’ụwa dum.”  Ma, lee! e buliri okwuchi ya dị okirikiri nke e ji opu mee; m wee hụ nwaanyị nke nọ ọdụ n’ime ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ahụ.  O wee sị: “Nke a bụ Ajọ Omume.” O wee nubaghachi ya n’ime ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ahụ,+ buru opu ahụ dị arọ kpuchie ọnụ ya.  M wee lelie anya hụ, ma, lee, e nwere ụmụ nwaanyị abụọ na-abịanụ, ha jikwa nku ha na-efe n’ikuku. Ha nwere nku yiri nku ụgbala. Ha wee bugoo ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ahụ n’agbata eluigwe na ụwa. 10  M wee jụọ mmụọ ozi ahụ na-agwa m okwu, sị: “Ebee ka ha na-ebuga ihe ọ̀tụ̀tụ̀ efa ahụ?” 11  O wee sị m: “Ha ji ya na-aga iwuru nwaanyị ahụ ụlọ+ n’ala Shaịna;+ ụlọ ahụ ga-akwụsikwa ike, a ga-ekusa nwaanyị ahụ n’ebe ahụ, n’ebe kwesịrị ya.”

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji