Gbanwee otú ọ ga-esi egosi

Họrọ asụsụ

Gaa na menu nke abụọ

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gaa n'Isiokwu

Ndịàmà Jehova

Igbo

Baịbụl nke Dị n'Ịntanet

BAỊBỤL NSỌ—NSỤGHARỊ ỤWA ỌHỤRỤ NKE AKWỤKWỌ NSỌ

Zekaraya 2:1-13

2  M wee lepụ anya hụ, ma, lee! e nwere otu nwoke nke ji ụdọ e ji atụ̀ ihe.+  M wee jụọ ya, sị: “Ebee ka ị na-aga?” O wee zaa m, sị: “M na-aga ịtụ Jeruselem, iji mata otú ọ hà n’obosara na otú ọ hà n’ogologo.”+  Ma, lee! mmụọ ozi ahụ nke na-agwa m okwu pụwara, e nwekwara mmụọ ozi ọzọ gawara izute ya.  O wee sị ya: “Gbaa ọsọ, gwa nwa okorobịa ahụ nọ n’ebe ahụ, sị, ‘“A ga-ebi n’ime Jeruselem otú e si ebi n’obodo na-enweghị mgbidi,+ n’ihi ụba mmadụ na anụ ụlọ ndị nọ n’ime ya.+  Mụ onwe m ga-aghọkwara ya mgbidi nke ọkụ gbaa gburugburu,+ ebube m ga-ejupụtakwa n’ime ya,”’”+ ka Jehova kwuru.  “Ngwanụ! Ngwanụ! Sinụ n’ala nke dị n’ebe ugwu gbapụ,”+ ka Jehova kwuru. “N’ihi na emewo m ka unu gbasasịa gaa n’akụkụ anọ nke ụwa,”+ ka Jehova kwuru.  “Lee anya, Zayọn!+ Gbapụnụ, unu ndị bi na Babịlọn.+  N’ihi na nke a bụ ihe Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru, ‘Mgbe e mesịrị ka ọ dị ebube,+ o zigara m ná mba ndị nọ na-ebukọrọ ihe unu;+ n’ihi na onye na-emetụ unu aka+ na-emetụ mkpụrụ anya m aka.+  N’ihi na, lee, m na-atụ ha aka,+ ha ga-aghọkwara ndị ohu ha ihe nkwata.’+ Unu ga-amata na ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha zitere m.+ 10  “Tisie mkpu ike, ṅụrịakwa ọṅụ, gị ada bụ́ Zayọn;+ n’ihi na, lee, m na-abịa,+ m ga-ebikwa n’ime gị,”+ ka Jehova kwuru. 11  “Ọtụtụ mba ga-esoro Jehova n’ụbọchị ahụ,+ ha ga-aghọkwa ndị m;+ m ga-ebikwa n’ime gị.” Ị ga-amatakwa na ọ bụ Jehova nke ụsụụ ndị agha zitere m ka m bịakwute gị.+ 12  Jehova ga-eweghara ala Juda ka ọ bụrụ òkè ya n’ala dị nsọ,+ ọ ga-ahọrọkwa Jeruselem.+ 13  Anụ ahụ́ niile, derenụ duu n’ihu Jehova,+ n’ihi na o siwo n’ebe obibi ya dị nsọ+ bilie ime ihe.+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji